AMOTEKUN DỊ MKPA-ATIKU

Spread the love

Abụja – Atiku Abubakar, Osote Onyeisiala n’oge gara aga ekwuola na ya kwadoro Amotekun, otu nchekwa ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ndịda.

Atiku, onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’afọ 2019 kọwara na o nweghị ihe dị njọ na ya bụ atụmatụ nke ga-enye ndị ọrụ nchekwa aka ichekwa obosara ala jupụtara na Naịjiriya.

O kwukwara na, etu o sịrị dị n’iwuala Naịjiriya, na isi mbụ n’ọrụ dịịrị Gọọmenti, bụ nchekwa ndụ nakwa akụnụba ụmụ amaala.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Paul Ibe, dere sị, “Ọ bụladị n’agba ọchịchị nke mbụ (first republic), tupu e sizia n’etiti chịwa Naịjiriya, e nwere imere atụmatụ nchekwa nke mpaghara dị iche iche si enyere ndị Uwe Ojii aka n’ọrụ ha.

” O doro anya na n’ime afọ iri gara aga, usoro ọrụ uwe ojii dị ugbua abụrụla  nke a gbatịrị ruo n’isi. Udiri nsogbu nchekwa dị ugbua mere na ọ dị mkpa ịghazigharị usoro ọrụ uwe ojii ala anyị”.

Leave a Reply

Your email address will not be published.