LEGỌS : ỌKỤ ỌGBỤGBA DAPỤTARA N’OKPORO MMANỤ NNPC AGBAGBUOLA MMADỤ ISE

Spread the love

Legọs – Nnukwu ọkụ ọgbụgba dapụtara ụnyahụ n’okporo mmanụ ụlọ ọrụ NNPC n’Ekoro dị n’akụkụ Abule -Egba nke Legọs Steeti.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nkụpu ndị ekperime kụpusiri okporo mmanụ ahụ iji zuru mmanụ ọkụ.

Akụnụba ya bụ ọkụ tariri buru ibu mana o nweghị onye nwụrụ na ya.

Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ Ntinyụ Ọkụ Legọs Steeti, Mazị Amodu, bụ onye kwuru na mmadụ ise nwụrụ ebe mmadụ iri abụọ merụrụ ezigbo ahụ na ya bụ ọdachi.

Kaosiladi, ọkụ ọgbụgba ahụ meziri ka ọtụtụ mmadụ si na be ha gbapụ iji zee ndụ.

Kọmishọna Legọs Steeti na-ahụ maka Mgbasa Ozi nakwa Ịtụpụta Atụmatụ, Gbenga Omotoso tinyekwara ọnụ n’okwu ahụ,

“Ọkụ ọgbụgba dapụtara n’okporo mmanụ na Abule-Egba. LASEMA nakwa ụlọ ọrụ nchekwa na nke ọrụ ntụmadị nọzị na-etinyụ ọkụ ahụ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.