MKPEBI ỤLỌIKPE IKPE MKPEDEBE: APC JI SOKOTO GBAA MGBERE MAKA KANO STEETI

Spread the love

Abụja – Ka Ụlọikpe Mkpedebe chụpụchara Emeka Ihedioha dịka Gọvanọ Imo Steeti n’izu ụka gara aga, a tụrụ anya na Umar Ganduje nke Kano Steeti ga-alakwa, ebe okwu ha abụọ bụ otu ihe.

Kaosiladi ụlọikpe Mkpedebe Naịjiriya mekwara ihe bụzi ejirimara ha, kemgbe Ọkaikpe Tanko Yusuf ji bụrụ Ọkaikpe Ukwu Naịjiriya, bụ enyeghịzị oyiri na mkpebi ha na-enye.

Otu ihe pụtara ìhè  bụ ejirimara mkpebi ụlọikpe bụ atụmatụ oyiri ikpe(Judicial precedent) nke bụ mgbado ụkwụ iji ma etu ikpe ọbụla kwesịrị isi bie site na ileru anya na ikpe ndị gara aga yitere ya.

Kaosiladi, Ụlọikpe Mkpedebe gara n’ihu kwado nhọpụta Gọvanọ Umar Ganduje nke Kano Steeti dịka nke ziri ezi n’agbanyeghị oyiri jupụtara n’ikpe ya na nke Ihedioha.

N’otu aka ahụ kwa, Ụlọikpe ahụ kwadokwara nhọpụta Aminu Waziri Tambuwal dịka Gọvanọ Sokoto Steeti.

Nkea mezịrị na ọtụtụ na-ahụtazị mkpebi Ụlọikpe ahụ dịka ‘i were nkea, i rie m ego’ .

Otu onye n’ime ha bụ Mazi Jackson Ude, onye bụbu Onye Nlekọta maka Mgbasa Ozi nakwa ịtụpụta atụmatụ n’ọchịchị Gudlọk Jọnatan.

Ude kwuru sị, “APC ji Sokoto were gbaa mgbere maka Kano Steeti. Ọ kaara ha mma ịhapụ Sokoto. Nkea bụkwa amansi ọzọ si n’aka ọchịchị Buhari na ndị otu ya ndị ụlọikpe mkpedebe ndị ohi”

Hmm, mkpebi ‘i were nkea, i rie m ego”. Ọ dịkwa egwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.