AMOTEKUN: EKITI STEETI GA ATỤGHARỊ IWU AMOTEKUN N’OLU YOROBA

Spread the love

Ado Ekiti – Kọmishọna na-ahụ maka Ikpe Nkwụmọtọ n’Ekiti Steeti, Mazị Olawale Fapohunda ekwuola na Gọvanọ Steeti ahụ  Kayọde Fayemi enyela ntụziaka ka a tụgharịa iwu hiwere atụmatụ nchekwa Amotekun nakwa ndị ọzọ nke Steeti ahụ n’olu Yoroba.

Usoro iwu nke e ji ehiwe atụmatụ nchekwa a kpọrọ  Ekiti State Security Network Agency nke a makwa dịka Amotekun abụrụla nke ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ekiti nọrọ ụbọchị Fraịdee gara aga mebe dịka iwu, were na echezi ka Gọvanọ Steeti ahụ tinye aka n’akwụkwọ banyere ya.

Fapohunda kwuru na Gọvanọ Kayode Fayemi iji mee ka izugbe ụmụ amaala Steeti ahụ ghọta ihe iwu ahụ na-ekwu n’asụsụ nke ha.

Ụfọdụ iwu ndị ọzọ a ga-atụgharịkwa gụnyere: Iwu Ekiti Steeti maka Nchekwaba Akụnụba (Mgbochi Ịnapụ ndị mmadụ ala ha n’ike), 2019, Iwu Ekiti Steeti Megidere Imekpa ụmụ nwanyị ahụ, 2019, wdg.

O kwuru na ọ bụ maka na iwu Amotekun metụtara ndụ ụmụ amaala Steeti ahụ nile nke ukwuu.

Hmm, Yoroba anaghịkwa achị chaa chaa.

Ndigbo, “ákwá ọkụkọ tiwaa akị…”

Leave a Reply

Your email address will not be published.