SARS EGBUOLA ONYE ỌGBA BỌL REMO STARS

Spread the love

Abiokuta – Ngalaba ndị Uwe Ojii na-achụ ndị oji-egbe-ezu (SARS) egbuola onye ọgba bọl nke otu egwu bọl Remo Stars, Tiyamiyu Kazeem, n’ebe Orile Imo dị n’ụzọ awara awara Shagamu – Abiokuta, Ogun Steeti ụnyahụ.

Ndị Uwe Ojii ahụ jidere ya na ọ bụ onye ‘yahoo’ oge ya na onye otu ya na Remo Stars, Sanni Abụbaka ji ụgbọala ya afa n’ụzọ, n’agbanyeghị na o gosiri ha akwụkwọ ejirimara ya dịka onye ọgba bọl.

Ha siri ọnwụ ịkpụga Kaseem n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii na Shagamu.

Kaosiladi, ha tinyeziri isi n’ụzọ awara awara Shagamu – Abiokuta nke mere onye a laworo mmụọ jiri jụọ ebe ha kpụzị ya aga.

N’ihi ya, ha kwụsịrị ụgbọala ahụ ma kwapụ ya, ụgbọala na-agbafe kụgbuziri ya.

E buru ya gbaga n’ụlọ ọgwụ Fakoya, ebe e kwuru na ọ nwụọlarịị.

Kaosiladi, ndị Uwe Ojii kwuru na nkea bụ asị.

N’okwu ya Mazị Abimbọla Oyeyemi, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii n’Ogun Steeti kwuru sị, “Ọ bụ ụgbọala kụturu ya gbalaga ka ọ chọrọ ịgbalahụ onye Uwe Ojii jidere ya.

” E jideghi ya maka yahoo kama e jidere ya maka na o nwere okpu ndi soja ọ na-eyi were emekpa ndị mmadụ ahụ ”

Abalị atọ gara aga ndị Uwe Ojii SARS gbagbukwara ndị ahịa mmadụ atọ na Shagamu.

Bikonu, kedu ihe mmadụ ji isi koro ebe ndị SARS nọ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.