COVID-19: SINETI INYE ỌKARA ỤGWỌ ỌNWA HA, HAPỤ EGO MMACHI AKPA HA BỤ AGHỤGHỌ – INTERSOCIETY

Spread the love

Abụja – Sinetọ Godiya Akwashiki, Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya nọrọ taa bụ Mọnde were kwuo na ndị Sinetọ nile ekpebiela iji ọkara ụgwọ ọnwa ha were nye onyinye ikwado agha a na-ebu megide ọrịa koro n’ala anyị.

N’ozi o zipụrụ ndị nta akụkọ, Sinetọ Godiya kwuru sị:

“Ụlọ Nzukọ Sineti chọrọ ikpupụta na site n’ọnwa Maachị afọ 2020, ndị Sinetọ nile gana-enye ọkara ụgwọ ọnwa n’onyinye iji kwado agha a na-ebu ịkwụsị nfesa ọrịa koro (COVID-19) n’ala anyị.

“Nkwado kwa ọnwa a sitere n’aka Sineti ala anyị ga-adịgide ruo na ya bụ ọrịa alaa na Naịjiriya”

Kaosiladi, ụfọdụ ndị Naịjiriya ahụtaghị nke a dịka ihe rijuru afọ.

N’okwu ya, Ichie Emeka Umeagbalasị, Onyeisi otu, International Society for Civil Liberties and Rule of Law (Intersociety) kọwara ya bụ onyinye ndị Sineti dịka aghụghọ

“Ego ole bụ ụgwọ ọnwa ha? Ego ole bụ ego Mmachi akpa (allowances) ha? Ihe anyị na-etiri mkpu kemgbe abụghị maka ụgwọ nwa ha. Ebe nsogbu dị bụ na udiri ego Mmachi akpa ha na – akwụ onwe ha.

” Ha chọọ inyeaka, ha kee ego Mmachi akpa ha ọkara. Ebe ahụ ka ha si ebuba ego gbara ọkpụrụkpụ”

Umeagbalasị kwakwara arịrị maka akparamagwa ọjọọ ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta Naịjiriya gosipụtara site na ịnọ na-ekesa onwe ya ụgbọala ọnụ ahịa riri akatamkpo ego ebe ọrịa koro tinyere ndị Naịjiriya nile na gbagharịa

” Udiri akparamagwa ọgbasaghịm a ha kpara e kwesịghị ekwesị maka ndị nọ n’ọkwa ọchịchị”

N’okwu nke ya, Comrade Erik Oluwole, Onye ndu ndị Ntorobịa n’ala Yoroba nakwa Onyeisi oche otu Coalition of Ethnic Nationality Youth Leaders of Nigeria (CENYLON) kwuru na kwanarị iri ise (50%) epeka

“Gịnị bụ kwanarị iri ise n’ụgwọ ọnwa ha. Ha kwesịrị inye opekata mpe kwanarị iri asatọ n’ụgwọ ọnwa ha tinyekwara ego Mmachi akpa ha iji kwado agha ịchụpụ COVID-19 n’ala anyị.

“Nke ka nke, Ụlọ Nzukọ ala anyị kwesịrị imebe iwu ga-eme ka ndị nile nọ n’ọkwa ọchịchị site na Gọọmenti Etiti ruo na nke Okpuru Ọchịchị, ma ngalaba Ọchịchị, ma ngalaba Mmebe iwu nakwa ngalaba Ikpe Nkwụmọtọ bụrụ ndị a ga-eke ụgwọ ọnwa ha tinyere ego Mmachi akpa ha nile ụzọ abụọ iji kwado agha a na-ebuso ọrịa koro nakwa iji hụ na Naịjiriya wulitere akarangwa ahụike ya etu kwesịrị ekwesị.

Oluwole kwuru na iwu a ga-emetụtata ma Onyeisiala ma ndị Mịnịsta tinyere ndị Gọvanọ, ọ kacha ego nchekwa (security vote) ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.