MBULI ỤGWỌ ỌKỤ GA-ADỊ IRE SITE N’ABALỊ IRI ATỌ N’ỌNWA JUUN-NERC

Spread the love

Abụja – Ụlọ ọrụ National Electricity Regulatory Commission (NERC) nọrọ taa kwuo na mbuli ụgwọ ọkụ ga-adị ire site n’abalị iri atọ nke ọnwa Juun afọ a.

N’ozi nke  Jems A. Momoh na Dafe C. Akpeneye, Onyeisi oche nakwa Kọmishọna na-ahụ maka iwu nakwa mgbaso usoro n’ụlọ ọrụ ahụ tinyere aka, ụlọ ọrụ NERC kọwara na mkpebi ahụ sitere na akwụkwọ ụlọ ọrụ nkesa ọkụ iri n’otu dị n’ala anyị detara maka ikike mbuli ụgwọ ọkụ.

Ụlọ ọrụ kwuru na ha kpọrọ ọgbakọ ọhaneze na mpaghara dị iche iche n’ala anyị site n’abalị iri abụọ n’ise nke ọnwa Maachị ruo n’abalị itoolu nke ọnwa Eprel afọ a.

Nchọpụta ha bụ na mbuli ụgwọ ọkụ agaghị ewute ndị na-amụ ọkụ ma ọ bụrụ na ụlọ ọrụ nkesa ọkụ ewelite aka ọrụ ha site na inye ọkụ etu kwesịrị ekwesị.

N’ihi ya, ụlọ ọrụ nkesa ọkụ ahụ nile nyere ụlọ ọrụ NERC atụmatụ nkwalite nkesa ọkụ ha bụ Performance Improvement Plan (PIP) nke a gbadoro ụkwụ were na – enye ha ikike mbuli ụgwọ ọkụ ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.