AKA AKPARALA ỤKỌCHUKWU NA-EDINYE NDỊ NA- EZU NDỊ ỤKA YA OHI

Spread the love

Kalaba – Aka ndị Uwe Ojii akparala Ụkọchukwu Rịchaadị Daniel, Onye Nlekọta Ukwu  nke ụlọ ụka Light And Faith Gospel Mission, Kalaba, Krọs Riva, Steeti ụnyahụ ka ndị ụka ya e jidere ya gara ohi kwuru na aka ya dị ya.

Ndị Uwe Ojii jidere Matiu Inyango na Daniel Bassey ka ha ji égbè na mma were gaa ohi n’ụlọ otu nwoke bụ Dọkịnta Pita Benson.

Ndị ekperime ahụ kọwara na ha bụ ndị nhazi (ushers) n’ụlọ ụka Light Gospel and Faith Mission, na ha na-amatakwa ndị ụka ha nwere ego site na akwụkwọ ndebanyeaha a na-enye ndị ọhụrụ.

Na ha na ebugara ụkọchukwu a akwụkwọ ndebanyeaha ahụ nile  ma a gbasaa ụka. Ụkọchukwu ahụ ga ejizi aka ya kpebie ụbọchị a ga – awakpo onye ọbụla.

Ha sịkwa na ọ bụ sọọsọ ndị ụka ha ndị nwere ego ka ha na ezu ohi,na ndị ọhụrụ ha zuworo ohi eruwo mmadụ iri n’isii.

A nwuchikọrọ ụkọchukwu ahụ ụnyahụ ka ọ na-aga ụka.

O kwetara na ndị ohi ahụ bụ ndị ụka ya mana na ọ gọrọ aka ya n’ụkwụ ya, na ya amaghị banyere ohi ha na ezu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.