CHAỊ! DIBỊA ATỤWALA NWUNYE ỤKỌCHUKWU IME

Spread the love

Otu onye dibịa na-ewu ewu na mba Gana aha ya bụ Jojo (Miracle Wonder) ka anyị nụrụ na ọ tụwala nwunye otu ụkọchukwu onye Igbo, Ụkọchukwu Sọnde Ike ime.

Ọhaneze na-ajụzị “kedụ ihe jikọrọ udele na onye ọ́kpụ̀ isi?” Kedụzi ebe mmiri si baa n’opi ụgbọrọ?

Akụkọ anyị na-enweta bụ na nwa dibịa ahụ bụ ya na-enye onye ụkọchukwu ahụ ike o ji arụ “ọrụ ebube”, na o nwekwara ụtụ(tithe) o kwesịrị ị na-atụrụ nwa dibịa ahụ kwa ọnwa atọ.

Kaosiladi, iwe were dibịa ahụ maka na ụkọchukwu ahụ anaghịkwa eme ka ha siri kpaa kemgbe otu afọ.

Nke a mere o ji kpebie imesi ụkọchukwu ahụ ike site na iji ọgwụ rata ma na edinakwa nwunye ya.

Na nke ndị Uwe Ojii, dibịa ahụ kwetara na ya na nwunye ụkọchukwu ahụ enweela mmekọahụ ihe ruru ọnwa isii.

Kaọdịtaa, nwunye ụkọchukwu dịịrị dibịa ime, onye mazị ihe ọ ga-amụ? Ikekwa ọ mụọ “Arụsị na-eje ụka”.

Ihe emebiwo! Ma dibịa eji ọgwụ ma o jighị ọgwụ, otu ihe doro anya bụ na ụkọchukwu a na nwunye ya amaghị Chineke chaa chaa.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.