IKESA NGWA NBELATA NHỊAMAHỤ ỌRỊA KORO: STEETI NDỊ ỌZỌ KWESỊRỊ IṄOMI ABỊA-GSAC

Spread the love

Enyemaka a ekwesịghị ịbụ sọọsọ maka ndị ụka – Intersociety

Ụmụahịa –  Otu Global Society for Anti-Corruption (GSAC) eburuwo ụkpa ekele bunye Gọvanọ  Abịa Steeti, Dọkịnta Okezie Ikpeazu maka etu o si mezuo nkwa ya site na ikesara ndị Steeti ahụ ngwa nbelata nhịamahụ maka ọrịa koro.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Enugwu  Onye Nlekọta ahụ na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze rịọrọ Steeti ndị ọzọ ka ṅomie Abịa Steeti

“A na m ekele Gọvanọ Abịa Steeti, Dọkịnta Okezie Ikpeazu etu o siri mezuo nkwa ya ma chetakwa ndị Steeti ahụ ndị mkpọchi obodo sitere n’ọrịa koro butere nhịamahụ si iche iche.

” GSAC ji ohere akpọku ndị Gọvanọ Steeti ndị ọzọ na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala anyị ka ha marakwa ihe ha mere ka agụụ ghara imerụ ndị Steeti ha, ndị ọrịa koro chụbara ụlọ ahụ”.

Oriakụ Nweke rịọkwara ndị Steeti ndị ọzọ ka ha na ndị otu kwụụrụ onwe ha (NGOs) na Steeti ha, ndị na-agaza ebe nile, marakwa ndị kacha chọọ enyemaka a jikọọ aka ọnụ ịhụ na enyemaka ọbụla ha nyere rutere ndị o kwesịrị irute aka.

N’okwu nke ya, Ichie Emeka Umeagbalasi, Onyeisi otu International Society for Civil Liberties and Rule of Law (Intersociety) kelekwara Gọọmenti Abịa Steeti.

Kaosiladi, o kwuru na ọ ka mma Gọọmenti ike ihe ọbụla n’ụlọ n’ụlọ karịa isi n’aka ndị ụka

“Gọọmenti Abịa Steeti gbalịrị. Kaosiladi, ọ ka mma ike ihe ọbụla a na-eke n’ụlọ n’ụlọ, karịa isi n’aka ndị ụka.

” Nkea ga-eme ka ọ ghara irute mmadụ nile. Ọ dịkwa ka nke Gọọmenti Anambara Steeti e kwuru bụ sọọsọ maka ndị ruworo afọ iri asaa.

“Ọ bụghị sọọsọ ndi ụka na ndi ruworo afọ iri asaa ga agụụ na-agụ”

Na nkenke mmemme e mere n’Obi Gọọmenti Abịa Steeti n’Ụmụahịa ụnyahụ, Osote Gọvanọ Steeti ahụ, Rt Hon Ude Oko Chukwu, nyefere ngwa nri, ego nakwa ngwa mgbochi ahụ dị iche iche n’aka ndị ụka dị iche iche maka ikesara ndị ogbenye na ndị nwere ọlụsị tinyere ndị okenye iji  belata nhịamahụ sitere na mkpọchi obodo maka ọrịa koro.

Ndi ụka nwetagasịrị enyemaka oge ahụ gụnyere ụka Katọliki, ndị Metọdist, ndị Assemblies of God Church, ndị The Apostolic Church nakwa ndị Alakụba.

Ihe e kere ha gụnyere; akpa osikapa, akpa àgwà, mba ji, ngwa mgbochi ahụ nakwa ego.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.