NSOGBU ỌRỊA KORO : DI NA NWUNYE EWERELA ỤKWỤ BỊA MA LAKWAA N’AGBAMAKWỤKWỌ HA

Spread the love

Nsogbu mkpọchi obodo so ọrịa koro emeela ka otu di na nwunye na mba Yuganda were nwayọọ jiri ụkwụ gaa ma latakwa ụbọchị agbamakwụkwọ ha.

Ihe kpatara nkea bụ maka Mmachi a machiri ụgbọala ọbụla ịgba n’ụzọ maka mkpọchi obodo ọrịa koro.

Nwoke na-agba akwụkwọ, Zoen Harrold nwa-afọ mba Amerịka na onye ọ chọrọ ịlụ bụ Gorret Namaseruka, onye Yuganda jikọrọ aka ọnụ dịka di na nwunye ụbọchị Satọdee gara aga bụ abalị anọ nke ọnwa Eprel, afọ 2020.

N’ihi mkpọchi obodo ọrịa koro, ndị bịara mmeme agbamakwụkwọ ahụ bụ sọọsọ mmadụ iri nke ụkọchukwu gbara ha akwụkwọ nakwa onye Uwe Ojii hụrụ na ha debere iwu mkpọchi obodo n’uju so n’ime ya.

Ebe a nọrọ mee ya bụ agbamakwụkwọ e bere nkenke bụ n’Ụlọ ụka Calvary Chapel si n’Entebbe.

Di na Nwunye ahụ yiiri onwe ha uwe ndị Afrịka a na-akpọ “African Prints” ma jikwara ụkwụ were bịa ma lakwaa na mmemme ahụ maka na a machiri ụgbọala ọbụla ịgba n’obodo ahụ.

Sọọsọ ihe a machighi bụ ígwè, nke mere na ụkọchukwu gbara ha akwụkwọ ji ígwè were bịa.

Hmm, “Ugwu mụta mgbaji ụkwụ…”. Ihe a nile bụ ihe ọrịa koro butere.

Leave a Reply

Your email address will not be published.