AHỊA EKEUKWU(OGUMABIRI) OWERE
Taa bụ ahịa Eke. Ahịa anyị gara taa wụ AHỊA EKEUKWU OWERE nke a makwara dịka EKE OGUMABIRI.
Eke Ogumabiri bụ Ahịa dị n’Owere nchise (obodo Owere nọ n’ime Okpuru Ọchịchị Owere Mepere Emepe (Owerri Municipal Council).
Ihe e ji akpọ ya Eke ụkwụ bụ maka na ọ na-azụ kwa abalị asatọ, ya bụ n’ụbọchị Eke ụkwụ nile. N’usoro ọgụgụ afọ (calender) Ndigbo, e nwere abalị anọ ; Eke, Orie, Afọ, Nkwọ n’ime òtù izu.
Kaosiladi, e nwekwara abalị asatọ n’ime izu, ma a gụọ Eke, Orie, Afọ, Nkwọ, Eke ukwu, Orie ukwu, Afọ ukwu na Nkwọ ukwu.
Owere nwekwara Ahịa Eke nta nke na-azụ kwa ụbọchị anọ.
Kaọdịtaa, Ahịa Eke Ukwu Owere na-azụzị kwa dáá dịka ahịa ndị ọzọ dị n’Ala-Igbo.
Ị bịa Ahịa Eke Ukwu Owere ịga enweta ụgba nwetakwa erimeri ndị ọzọ
– Onye gara ahịa taa bụ
MAZỊ CHINỌNYERE ALBAN ONYEKWERE