Abụja: Ozi na-erute anyị ntị ugbua gosiri na Onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ Sinetọ Bola Tinubu e nweela nsogbu. Etu ihe si kwụrụ ugbua, APC tiwazịrị ụzọ abụọ maka ndọrọndọrọ ndị ga-anọ n’isi na ngalaba Omebeiwu nke Gọọmenti Naijiria. Tupu ugbua, Tinubu bubu n’obi ime ka o siRead More →

Nsukka: Aka ndi uwe ojii nọ na Nsụka akparala okongwu arụrụala dinara nwatakịrị dị afọ iri. Mazị Ịmanụel Ugwu bụ onye laworo ezumike nká n’ọrụ bekee jiri ụzọ aghụghọ rabata nwatakịrị ahụ bụ Chisom Odo n’ime ụlọ site na ịdị ye gaa zụtara ya ihe. Okongwu arụrụala a, onye rụburuRead More →

Messi, aṅachaala ka ákwà! Ihe bụ akụkọ abụghị na Otu egwu bọl Liverpool nke Ingland jiri ọkpụ anọ asaghị asa were sụọ ndi otu egwu bọl Barcelona akwụ. Ihe na-ewu ị bụ na Lionel Messi, odogwu riri amosu n’egwu bọl aṅachaala ka ákwà. Ndị nkea kacha afụ ụfụ n’obi bụRead More →

Kano: Ọchịagha Hisbah na Kano Steeti, Nabahani Usman,ekwuola sa site taa bụ Mọnde bụ ụbọchị oge ebumọnụ ndị Alakụba na-amalite na ha ga-amalite ijide okenye ọbụla ha nwetara na-eri ihe n’iro. Hisbah bụ otu ọrụ nchekwa Sharia. O kwuru na sọọsọ ihe ga-eme ka ha hapụ ndị e jidere bụRead More →

Enugwu: A nọrọ taa n’ụlọ ezumezu dị na Toprank hotel, E ugwu were hiwe otu South East for President 2023 bụ otu na-agba mbọ ka ọchịchị Naịjirịa rute Ndigbo aka n’afọ 2023. N’ozi nnabata ya, onye nlekọta otu a bụ Ụkọchukwu Oké Chukwu Obiọha kwuru na oge eruola mgbe onyeRead More →

Legọsị: Otu nwata nwoke afọ tara mmiri anọrọla na Legọsị chee nwatakịrị oku n’aka bụ nwa nwanne ya nwoke ncha mmiri mmiri e ji asa efere bụ Sunlight. Nwoke ahụ aha ya bụ Ifeanyị Udeoye onye gbara afọ iri atọ n’otu ma bụrụkwa onye Ihiala dị n’Anambara Steeti kọwara naRead More →

IBADAN –Otu nwokọrọbịa bụ Azeez Morufu ka aka nọrọ ụnyahụ na Dugbe dị n’Ibadan kpara ka ọ na-ewere ego n’igwe ATM n’ejighi kaadị ATM ọbụla. Ọ bụzị onye na-agafe hụrụ ihe ịtụnanya a were tie mkpu mere ka ndi nche ụlọakụ ahụ dị n’akụkụ ụlọọrụ Redio Naịjiriya, Ibadan were jidezie ya.Read More →

ỤLỌ NZỤKỌ OMEBEIWU YUROP akwadoola n’uju mkpebi na-aga akwụ mba Afrịka ụgwọ ndokwa maka arụ nile ndi ọcha kpasara ndi isi ojii oge Yurop chịrị Afrịka. Iwu ọhụrụ ahụ chọrọ ka mba dịgasị na Yurop weta usoro mgbanwe iji belata mmegide a na-emegide nde pụrụ nde ndi isi ojii bụRead More →

ASABA: Aka na-achị Delta Steeti bụ Dọkịnta Ifeanyi Okọwa ekweela ndi nkuzi na ndi ntorọbịa Anịọma nkwa na ọchịchị ya ga ewepụ nkuzi olumba ndi Anịọma ọbụla n’ụlọ akwụkwọ dịgasị na steeti ahụ. Ifeanyi Okowa toro ha maka mbọ pụrụ iche ha gbara maka ịdịnotu ndi Anịọma. Ọ kọwara naRead More →

Abakiliki: Dọkịnta Ogbonnaya Ọnụ bụ aka chịburu Abịa Steeti ka anyị nụrụ na o nwere nnukwu ihe mberede okporo ụzọ ụnyahụ n’Abakiliki. hoo!haa!! nụrụ na ya bụ ọdachi dapụtara ka ọ nọ njem achụmnta nkwado maka Onyeisiala bụ Muhamadu Buhari. Aka na-achị Ebọnyị Steeti, Injinịa Dave Ụmahị gakwara leta yaRead More →

IJIPT: Ụlọikpe nọ na mba Ijipt atụọla onye nta akụkọ na-arụ n’ụlọọrụ mgbasa ozi televishọnụ nga otu afọ maka ịgba akwụla nwoke na-edina ụmụ nwoke ajụjụ ọnụ n’oge mmemme ya. Mohammed el-Gheiti bụ onye ụlọikpe sịrị na ọ dara iwu site na ịkwado arụrụ ala maka mmemme ya nke eRead More →

Ọka: Ụlọọrụ ndi uwe ojii n’Anamabra Steeti ekwuputala ka izu ịba ụmụ nwanyị na-ewuzi na steeti ahụ ugbua si emetụ ha n’ahụ. Ha rịọkwara ka onye ọbụla mụrụ anya dịka azụ maka na oke anaghi eri ihe onye mụ anya. Ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na steeti ahụ bụ MazịRead More →

ARỌCHUKWU: Ọgbaghara dapụtara n’Ihechiọwa dị n’Okpuru Ọchịchị Arọchukwu n’Abịa Steeti ụnyahụ mgbe ndi ntorọbịa obodo ahụ nọchiri onye ji aha otu ndọrọ ndọrọ APC azọ ọkwa Sineti ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Abịa Steeti bụ Dọkịnta Ọjị Ụzọ Kalụ mgbe ọ bịara ịchụ nta nkwado ebe ahụ. Site n’ozi anyị nwetara,Read More →