Okpokoro ụgbọelu ogbunigwe gbatara.Ndi agha ụgbọelu Naịjiriya gburu opekata mpe ya bụrụ madụ iri atọ n’ise mgbe ha tụpụrụ ogbunigwe n’obodo nta dịgasị n’Adamawa Steeti n’ọnwa Disemba gara aga, ọ bụ otu Amnesty International kwuru nkea n’ozi ha wepụtara ụnyahụ. Ọnụ na-ekwuru ndi agha ụgbọelu bụ Olatokunbo Adesanya gọrọ agọRead More →

Makurudi: Samụel Ọrtọm, Aka na-achị Benuwe Steeti sịrị na ọ dịka ndi na-achị ehi nakwa ehi ha nwekwuziri iwu aka-akpa- n’isi (immunity) nke ọ bụ sọọsọ Onyeisala n’Osote ya nwere site n’usoro iwu ala Naịjiriya. Gọvanọ a kwuru nkea maka okwu Mansur Dan Ali bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka Nchekwa.Read More →

 Enugwu: Ọhaneze Ndigbo akatọọla kọmiti madụ iri nke Osote Onyeisiala, Ọkammụta Yemi Osinbajọ nọ n’isi ya nke otu National Economic Council (NEC) guzobere iji leba anya n’ọgbaghara dị n’etiti ndi na-achị ehi na ndi ọrụ ụgbo n’ala a. N’ozi nke  Onye ndụmọdụ ya n’okwu mgbasa ozi, Ichie Emeka Atama tinyereRead More →

Abụja: Ozi si n’aka Ụlọọrụ Onyeisiala na-egosi na otu ogbueyiọhaegwu mbaụwa ndi Alakụba bụ Islamic State (IS) ezobatala na steeti ndi ụfọdụ n’ala a dịka  Benuwe, Kogi nakwa Edo iji were malite ịkpa mkpamkpa nakwa ịla ndụ ndi mmadụ n’iyi. Kaosinadi, ndi ọrụ nchekwa obodo ọkacha ndi ụlọrụ Department of StateRead More →

Abụja: Osote onyeisi ụlọ nzukọ omeibeiwu ukwu (Sineti) Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadụ nọrọ ụnyahụ kwuo na ike ekpere otu nkeji maka ndi aka ha dị ọcha ndi ogbu ọchụ ndi Fulani na-akwafu ọbara ha agwụla ndi Sineti. Ekweremadụ kwuputara iwe juru ya n’obi maka etu esiri ala ndụ ụmụafọ NaịjiriyaRead More →

Enugwu: Otu onye ogbuanụ, Maikel Kịngslị, ejirila mma sụgbuo onye otu ya bụ,  Ifeanyi Egwuagu . Nke a mere ụnyahụ n’ebe Artisan, Ogui, Enugwu.   Onye a lara mbọ ka ejiri karama akụwara akụwa were sugbuo ya mgbe ọ na-egbo ọgụ n’etiti Mazị Kịnslị  na onye ogbuanụ ọzọ bụ Ogidi. ỌnụRead More →

Taa bụ ORIE NDỌKỊ. Ndọkị dị n’Okpuru Ọchịchị ỤKwa East nke Abịa Steeti. Obodo ahụ dịdebere osimiri. N’ihi ya ndi Ndọkị bụ ndi ọkụ azụ nakwa ndi na-akpọ ụgbọ mmiri nke ọma. Orie Ndọkị bụ nnukwu ahịa e nwere na mpaghara ebe ahụ. Ihe a na-enwetekarị n’ahịa ahụ gụnyere azụRead More →

  WỌRỊ:   Ndi agha  Joint Task Force nọrọ ụbọchị Tọọzdee were gbagbuo otu onye ọnụọ ọlaa Naịja Delta ka ha na ha na-akwakọrịta mgbọ. Asịrị na ndi ọlụọ ọlaa ahụ jiri ngwa ọgụ katara ahụ wakpo ụlọ ikwu  ndi agha ahụ n’Aladja. Ozi anyị nwetara bụ na ya bụ nkwakọrịtaRead More →

Abụja: Mazị Ịmanuel Zopmal, Onye isi ndi ntorọbịa nke mpaghara Obinetiti Naịjiriya bụ Middle Belt Youth Council akatọọla ozi afọ ọhụrụ nke Onyeisi Muhammadu Buhari jiri kwuo na Ihazighari Usoro Ọchịchị Naịjiriya (Restructuring) adịghị mkpa. Zopmal kwuru na Buharị ga ekwetalata maka Ihazigharị Usoro Ọchịchị Naịjiriya n’ihi na nke ahụRead More →

Abụja: Otu Ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) agwala Gọọmentị Etiti  nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) ka ọ gwa ndi Naịjiriya eziokwu banyere ego enwetegasịrị na ire mmanụ agbidi, ọ kacha nke ụlọ-ọrụ iri n’asatọ edebanyeghi aha ha n’akwụkwọ bụ ndi nke e  jiri bupu maRead More →

Aka na-achị Ekiti Steeti, Ayodele Fayose, ekwuola na ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari kpachara anya mee ka enwe ụkọ mmanụ ụgbọala iji majaa ndi Naijiriya ka ha kweta na ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala.   O kwuru na Gọọmentị Etiti chọrọ ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ma na ha amaghị kaRead More →

Ka ndi ụka Kraịstị na-eme emume Ekeresimesi, Onyeisiala Naịjiriya, Muhammadu Buhari akpokuola ndi Naịjiriya nile ka ha kpewere ndi agha ndi nọ n’ọgbọ ọgụ ekpere, ma kwukwaa na a ga-ekpocha ndi nile na-achọghị ịdịnotu Naịjiriya. Buhari nọkwara n’ozi Ekeresimesi ya kwuo na inwe obisike nke ndi agha ndi a ga-emeRead More →

Uyo: Ebelebe gburu ka a na-achọ ịgba ekeresimesi na mgbede Tọọzdee mgbe onye ọkwọ ụgbọala na-agba ọnwụ ọnwụ kụgburu mmọnwụ na-agara onwe ya n’ụzọ Nwaniba n’ebe Use Offot. Ya bụ mmọnwụ nke a na-akpọ “Ekpo” n’olu ndi Ibibio ka anyị nụrụ na ọ nwụnyụrụ anya ozigbo ozigbo n’ihi oke ọsọRead More →

Taa bụ Orie. A gbara m ụzọ gaa ORIE NOMEH ga zụta osikapa na mmanụ nri maka ekerismesi. Nomeh dị n’okpuru ọchịchị Nkanụ East. Ọ dibebere Nenwe nakwa Ụgbaawka. E nwekwara ọdụ Ụgbọ oloko n’ebe ahụ. Mmanụ nri na-adị egwu. A makwara ha ama maka ịkọpụta osikapaRead More →

Sọltan Sokoto, Mohammad Sa’ad Abubakar abachiela ndi isi Ulọakwụkwọ iwu nke Naịjiriya (Nigerian Law School) ntị maka ịmachi ụmụ nwanyị ịsụ ịchafụ ndi alakụba a na-akpọ hijab. O kwuru na hijab bu usoro ekike ziri ezi maka ụmụ nwanyị ndi Alakụba. N’okwu ya ụbọchi Satode gara aga n’ọgbakọ ise nkeRead More →

Taa bụ ụbọchị ụka ma bụrụkwa ahịa EKE. Onye gara ahịa taa? Ngwanụ. Ọ kwa Puku Naịra Atọ ka a ga-erite n’asọmmpi ị ga-ahịa   N3K!!!!!!!!!  Read More →

  Jalingo:  Gọvanọ Darius Ishaku nke  Taraba Steeti nọrọ ụnyahụ were kwuo na-enwere otu na-achọ ịwakpo steeti ahụ. O kwuputara nke a mgbe ọ na-emeghe Mmemme Omenala Taraba na Jalingo Ka osinadị, Gọvanọ a akpọghị okwu ahasite na ịkpọ aha ndi a ọ sị na ha na-achọ ịwakpo steeti ya.Read More →