WỌRỊ:   Ndi agha  Joint Task Force nọrọ ụbọchị Tọọzdee were gbagbuo otu onye ọnụọ ọlaa Naịja Delta ka ha na ha na-akwakọrịta mgbọ. Asịrị na ndi ọlụọ ọlaa ahụ jiri ngwa ọgụ katara ahụ wakpo ụlọ ikwu  ndi agha ahụ n’Aladja. Ozi anyị nwetara bụ na ya bụ nkwakọrịtaRead More →

Abụja: Mazị Ịmanuel Zopmal, Onye isi ndi ntorọbịa nke mpaghara Obinetiti Naịjiriya bụ Middle Belt Youth Council akatọọla ozi afọ ọhụrụ nke Onyeisi Muhammadu Buhari jiri kwuo na Ihazighari Usoro Ọchịchị Naịjiriya (Restructuring) adịghị mkpa. Zopmal kwuru na Buharị ga ekwetalata maka Ihazigharị Usoro Ọchịchị Naịjiriya n’ihi na nke ahụRead More →

Abụja: Otu Ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) agwala Gọọmentị Etiti  nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) ka ọ gwa ndi Naịjiriya eziokwu banyere ego enwetegasịrị na ire mmanụ agbidi, ọ kacha nke ụlọ-ọrụ iri n’asatọ edebanyeghi aha ha n’akwụkwọ bụ ndi nke e  jiri bupu maRead More →

Aka na-achị Ekiti Steeti, Ayodele Fayose, ekwuola na ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari kpachara anya mee ka enwe ụkọ mmanụ ụgbọala iji majaa ndi Naijiriya ka ha kweta na ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala.   O kwuru na Gọọmentị Etiti chọrọ ibuli ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ma na ha amaghị kaRead More →

Ka ndi ụka Kraịstị na-eme emume Ekeresimesi, Onyeisiala Naịjiriya, Muhammadu Buhari akpokuola ndi Naịjiriya nile ka ha kpewere ndi agha ndi nọ n’ọgbọ ọgụ ekpere, ma kwukwaa na a ga-ekpocha ndi nile na-achọghị ịdịnotu Naịjiriya. Buhari nọkwara n’ozi Ekeresimesi ya kwuo na inwe obisike nke ndi agha ndi a ga-emeRead More →

Uyo: Ebelebe gburu ka a na-achọ ịgba ekeresimesi na mgbede Tọọzdee mgbe onye ọkwọ ụgbọala na-agba ọnwụ ọnwụ kụgburu mmọnwụ na-agara onwe ya n’ụzọ Nwaniba n’ebe Use Offot. Ya bụ mmọnwụ nke a na-akpọ “Ekpo” n’olu ndi Ibibio ka anyị nụrụ na ọ nwụnyụrụ anya ozigbo ozigbo n’ihi oke ọsọRead More →

Taa bụ Orie. A gbara m ụzọ gaa ORIE NOMEH ga zụta osikapa na mmanụ nri maka ekerismesi. Nomeh dị n’okpuru ọchịchị Nkanụ East. Ọ dibebere Nenwe nakwa Ụgbaawka. E nwekwara ọdụ Ụgbọ oloko n’ebe ahụ. Mmanụ nri na-adị egwu. A makwara ha ama maka ịkọpụta osikapaRead More →

Sọltan Sokoto, Mohammad Sa’ad Abubakar abachiela ndi isi Ulọakwụkwọ iwu nke Naịjiriya (Nigerian Law School) ntị maka ịmachi ụmụ nwanyị ịsụ ịchafụ ndi alakụba a na-akpọ hijab. O kwuru na hijab bu usoro ekike ziri ezi maka ụmụ nwanyị ndi Alakụba. N’okwu ya ụbọchi Satode gara aga n’ọgbakọ ise nkeRead More →