EGO/OGARANYA Spread the love Post Views: 178 EGO/OGARANYA Share this:Click to share on Twitter (Opens in new window)Click to share on Facebook (Opens in new window)Click to share on Google+ (Opens in new window) Related 2017-11-24
Obughi ima ogaranya ora bu isi kama kedu ebe i ga arahu ubochi ahu?
0
0
Okwu baa n’ego ogbenye esere onu ya
0
0
Na Nwa ogaranya Ana erika bu na nne na nna ya n’eri.
0
0
Nwata kwuwaa onu o si na ya agwagbuola ogaranya n’okwu.
0
0
Ego biara ahia nwere onye obu nke ya
0
0
Nwa ogaranya tijie odu o were nke nna ya kwuo ugwo.
0
0
Onweghi ihe aga agwa nwa ogaranya abughi na o na eri ka onye ochi.
0
0
Ego di n’ogwu
0
0
Onye ji ego ji ogwu
0
0
Nwa ogaranya abughi oru.
0
0
Ego (aku) uwa eju afo
0
0
Oriri ego adighi adi ka n nweta ya
0
0
Ego e jiri gba ofo-ogeri abughi ya ka e jiaba uba.
0
0
Onye ukpa ghuruanya, o tinyebedi ego na mpko oke eburu ya.
0
0
Onye aturu ilu ma kowakwara ya, ego e jiri luo nne ya bu ihe furuefu.
0
0