NWOKE ỊTALI EGBUOLA AKWỤLA NWANYỊ NAỊJIRIYA NA ONYEJUGHI YA AFỌ

Spread the love

 

Rome: Aka akparala otu nwoke onye Ịtali dị afọ iri anọ n’otu bụ Leopoldo Scalici maka igbu akwụla nwa Naịjiriya bụ Benedicta ma tunye ozu ya n’olulu.

Ozi hoo!haa!!nwetara bụ na nkea mere n’obodo Modena Nord ebe Mazị Scalici kpọtara ya bụ akwụla ka ha nọrịa.

Mana esemokwu dapụtara ka ha nwechara mmekọ nke butere nwoke ahụ ịkpụrụ ihe dị arọ kụọ ya n’isi were kugbuo ya.

Akụkọ na-akọzị na ọ kụgburu ya maka na mmekọ ha mekọrọ ejughi ya afọ. Ya bụ, ọ ka na-agụ Scalici ma Benedicta jụrụ inyekwu ya ọzọ.

Ndi uwe ojii mba Ịtali akpọchiela nwoke ahụ

 

1 Comment

  1. Ụfọdụ ụmụ nwoke ịkwa iko anaghị eju ha afọ ma ọlị.

    Nke a bụ ezigbo ihe ọjọọ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.