DEEDE ARỤRỤALA ECHEELA NWA NWANNE YA NCHA

Spread the love

Legọsị: Otu nwata nwoke afọ tara mmiri anọrọla na Legọsị chee nwatakịrị oku n’aka bụ nwa nwanne ya nwoke ncha mmiri mmiri e ji asa efere bụ Sunlight.

Nwoke ahụ aha ya bụ Ifeanyị Udeoye onye gbara afọ iri atọ n’otu ma bụrụkwa onye Ihiala dị n’Anambara Steeti kọwara na iwe ya bụ na nwanne ya nwoke gara lụta ajọ nwanyị, onye nke ọ sị na ọ bụ amosu.

Site n’ozi anyị nwetara, nkea mere na mpaghara Orile dị na Legọsị ụbọchị Satọdee gara aga. Ndi uwe ojii akpọchiela ya bụ ajọ deede onye kpara agwa ka nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu.

Obere nwatakịrị nwanyị ahụ nọkwa n’ụlọ ọgwụ ebe a na-azọ ndụ ya.

Ichie Emeka Udeoye bụ nna ya bụ nwatakịrị sịrị na ihe kacha ewute ya bụ na enweghị ụzọ ya siri mejọọ nwanne ya nwoke, onye nke ọ zụrụ na mahadum kpatara ọ ga-eji rụsa nwa ya e ku n’aka udiri arụrụ ala a.

“Ọ bụ eziokwu na ya na nwunye m adịchaghị na mma mana amaghị na nwanne m ga-enwe obi ịrụsa nwa m, ọbara ya udiri arụrụ ala a. Kedu ihe nwa bịara ụwa na enweghi ihe ọ ma mere ya?”

 

1 Comment

  1. Nwokoroobia kpa kwara ezigbo arụ na enweghị atụ

    Ndị mmadụ na ajọ omume
    Tufiakwa




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.