IGBO GA-ABỤ ONYEISALA 2023-OBIOHA

Spread the love

Enugwu: A nọrọ taa n’ụlọ ezumezu dị na Toprank hotel, E ugwu were hiwe otu South East for President 2023 bụ otu na-agba mbọ ka ọchịchị Naịjirịa rute Ndigbo aka n’afọ 2023.

N’ozi nnabata ya, onye nlekọta otu a bụ Ụkọchukwu Oké Chukwu Obiọha kwuru na oge eruola mgbe onye Igbo ga-ewe ghara ọchịchị na Naijiria maka na “e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma” Ọ kọwakwara na ihe butere otu dị ka MASSOB na IPOB ji achọzị Biafra bụ maka mkpagbu na mmegbu Ndigbo na-agabiga taa na Naijiria n’agbanyeghị oke mbọ ụmụafọ dị ka Dọkịta Nnamdi Azikiwe gbara maka nnwere onwe Naijiria.

N’okwu nke ya, onyeisi oche mmemme ahụ bụ Ambassador Grant Ehiobuche kọwakwara na ọ dị oké mkpa Ndigbo na mpaghara Naijiria ndị ọzọ ijikọ aka ọnụ ọkacha ụmụnne anyị, ndị Yoroba.

Ndị welitere isi bịara mmemme ahụ gụnyere Ọkammụta Chinedu Nebo, onye  bụbu Mịnịsta na-ahụ maka Ọkụ, Nna Ụkọchukwu Obi Ọnụbọgụ, Ọkaiwu Maxi Okwu, onye zọbuworo ọkwa onye isiala tinyekwara Nwa-ada Nkọlị, onye nlekọta otu a na mba ofesi.

Nwa-ada Nkọlị kwekwara nkwa ịhụ na-eji were otu ahụ na mba ofesi dị iche iche

1 Comment

  1. Nkea di Mma. Anyi na atunye otu Ukwu otu otu Ukwu. Akpagide nkata otu ubochi, oghoro ngiga.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.