A GA-EBIDO IJIDE NDI NA-ERI IHE N’IRO NA RAMADAN

Spread the love

Kano: Ọchịagha Hisbah na Kano Steeti, Nabahani Usman,ekwuola sa site taa bụ Mọnde bụ ụbọchị oge ebumọnụ ndị Alakụba na-amalite na ha ga-amalite ijide okenye ọbụla ha nwetara na-eri ihe n’iro. Hisbah bụ otu ọrụ nchekwa Sharia.

O kwuru na sọọsọ ihe ga-eme ka ha hapụ ndị e jidere bụ ma ha gosi akwụkwọ ikike si n’aka dibịa oyibo na ahụ adịghị ha ma ọ bụkwanụ gosi na ha na-arịa ọrịa ọnyá afọ (ulcer).

Ọ kọwakwara na tupu ahapụ onye ahụ, a ga-adọ ya aka na ntị ka ọ hara iri kwa ihe n’ezi ọzọ.

Ọchịagha Hisbah a nọrọ n’izu ụka gara aga were kpọchie ndi akwụla na ndị omekome ole ole iji kwadebe maka ọnwa dị nsọ nke Ramadan.

“Ndị ọrụ m ga-enwudo onye Alakụba ọbụla e nwetara na-eri nri n’iro na-abụghị ma o gosiri ikike si n’aka dibịa oyibo na ọ gaghị ebunwu ọnụ.”

Kano Steeti malitere Sharia kemgbe afọ 2001 oge Rabiu Kwankwaso bụ Gọvanọ.

Ndị Alakụba imere onwe ha Sharia nakwa ebumọnụ so ya n’azụ magburu onwe ya mana nsogbu bụ na ọtụtụ oge ndị Hisbah na-ejidekwu ndi ụka, ndị na-esoghị ha ekpe Alakụba maka ịda iwu ha.

hoo!haa!! na-ajụ ị sị, “Ebe ọ dị mkpa na nwa mụọ emegbughi nwa mmadụ nke nwa mmadụ ji emegbu nwa mụọ, keduzi ka a ga-esi kwọ onye ukwu wara?”

Leave a Reply

Your email address will not be published.