LIVERPOOL 4-BARCELONA O:MESSI AṄACHAALA!

Spread the love

Messi, aṅachaala ka ákwà! Ihe bụ akụkọ abụghị na Otu egwu bọl Liverpool nke Ingland jiri ọkpụ anọ asaghị asa were sụọ ndi otu egwu bọl Barcelona akwụ. Ihe na-ewu ị bụ na Lionel Messi, odogwu riri amosu n’egwu bọl aṅachaala ka ákwà.

Ndị nkea kacha afụ ụfụ n’obi bụ ndị na-agba chaa chaa, ndi tinyere ego na Messi ga-enyetalata ọbụla dị otú ọkpụ na Anfield.

N’ezie, ụmụ Liverpool kpara ike dị egwu ọ kacha Divock Origi na Gịnị Wijnaldum, ndị nyere ọkpụ abụọ ọkpụ abụọ mana onye ọbụla kiriri agba nke mbụ a gbara na Camp Nou ga-ahụ na úkwù na-eji ị agụ. Liverpool na-agba bọl Barca a na-enye ọkpụ.

Na nke ụnyaahụ, MESSI gbagidere ihu gbawakwuo azụ ka Liverpool ghara imezu ya ọkpụ ise. Ọ kwachara aka gbakwuo ma ụkwụ. Ụfọdụ na-ajụ ma afọ a na-asazị Messi ka ọ bụ na Jurgen Klopp ma ọgwụ ya?

Nke bụ ezie bụ na ọ na-abụ “okoro tochaa, ọ chere ibe ya”. Messi wuru dịka ọ gaghị ewucha ewucha mana nkà abịala. Ihe karịrị afọ iri Lionel Messi na Cristiano Ronaldo mere ka a ghara ịnụ aha onye ọzọ n’asọmmpi egwu bọl site na ijitu onyinye nturugo okaibe egwu bọl mba ụwa n’etiti ha abụọ, onye butu onye nwanne ya.

Mana, ihe nile nwere oge. Ọ doola anya na Messi taa abụghịzịwa Messi ụnyaahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.