Enugu: Mallam Denja Abdulahi bụ onyeisi otu Association of Nigerian Authors (ANA), nke bụ otu jikọrọ ndị edemede na Naijiriya nakwa osote ya bụ Dọkịnta Camillus Ụka anọrọla ụnyaahụ, abalị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa Juun nke afọ a n’Enugwụ were hiwe otu nhazi maka ọgbakọ ukwu kwa afọ ha nkeRead More →

Madụ agaghị anọ be ya were nọpịa ihe ya. Ya mere ndị Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri nke Enugwu Steeti jiri pụta n’igwe were chụlaa ndị Fulani ndị nchị ehi nakwa ehi ha karịrị otu puku ha chịrị wakpo ndị obodo ahụ n’isi ụtụtụ taa. Site n’ozi hoo!haa!! nwetara ndịRead More →

Afenifere agwala ndị Yoroba ka onye ọbụla dị njikere ịzọ isi onwe ya n’aka ndị Fulani ọbụladị site  n’iji ọtụmọkpọ maka na olileanya ọbụla adịghị n’aka ndị Gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naijiriya maka nchekwa. Ọnụ na-ekwuru otu a bụ Mazị Yịnka Odumakin kwuputara nkea mgbe ọ na-ekwu banyere ndị njemRead More →

Awụsa abatakwanụ Ọka! Nke na-eme ugbua bụ na ndị Fụlani akpọọla ekwo nkụ ịga n’ihu n’atụmatụ ha iji napụ agbụrụ ndị ọzọ nọ na Naijiriya ala ha n’ike. Ozi si Benuwe Steeti na-egosi na Gọọmenti Etiti Naijiriya site n’aka Mịnịstrị na-ahụ maka Ọrụ ugbo degaara Gọọmentị steeti ahụ akwụkwọ makaRead More →

Abuja: Otu Nenwe Integrity Foundation (NIF) nọrọ ụnyaahụ, abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa Juun nke afọ a n’ụlọ ezumezu ndị agha a na-akpọ Army Headquarters officer’s Command Mess 1, Abuja were kwanyere Osote Onyeisi ndị Uwe ojii na Naịjiria bụ DIG Godwin Nwobodo ugwu maka mbuli n’ọkwa ya. NdịRead More →

Enugwu: N’agbanyeghị na enweela onye nlekọta ụlọ ọgwụ ọhụrụ n’ụlọ ọgwụ UNTH, Ituku-Ọzara, arụ na mpụ ka na-arị ibe ya elu n’ebe ahụ. Nke na-akpọtụ ugbua bụ chandum e gwụrụ ọtụtụ ndị dibịa oyibo nnọtu (resident doctors) tinyere akwụkwọ anamachọ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị kwụrụRead More →

ARỤ! Mmọnwụ na-aṅụ Hero! Nkea mere eme na ngwụcha izu ụka gara aga. Ụmụ okorobịa na-eti mmọnwụ bịaruru ebe ndị mmadụ gbakọrọ, gbaa egwu, gbaa egwu, wụgharịa etu o siri kwesị. Ka o mechara, ụmụ nwoke nọ ebe ahụ aṅụ mmanya gwara ya na ego adịghị kama ọ chọọ mmanya,Read More →

INDIA: Flavour “N’abanịa” e mekwaala ka ọ si eme. Ozi ruru hoo!haa!! aka na-ekwu na Flavour akpọrọla “nwa ya nwoke” bụ Semah Weifur, nwa Liberia so ya agụ egwu kpụrụ isi gaa New Delhi, India Maka ịwa ya anya iji mee ka ọ hụwa ụzọ. Nwatakịrị nwoke a bụ SemahRead More →

Enugwu: Ngosipụta Nka “Word4Word Art Project” na-aga n’ihu ugbua n’Enugwu n’ogige National Gallery of Arts, Enugwu. Site na nkọwa Mazi Ikenna Nwachukwu bụ onyeisi otu Word4Word Art Project, ngosipụta  nka a ga na-abụ kwa ọnwa atọ.  Ikenna Nwachukwu, onyeisi Word4Word  Isiokwu ngosipụta nka nkea bụ “Omenala Ọchịchịrị” nke na-arụtụ akaRead More →