ANA EHIWELA OTU NHAZI “COAL-CITY HOMECOMING 2019”

Spread the love

Enugu: Mallam Denja Abdulahi bụ onyeisi otu Association of Nigerian Authors (ANA), nke bụ otu jikọrọ ndị edemede na Naijiriya nakwa osote ya bụ Dọkịnta Camillus Ụka anọrọla ụnyaahụ, abalị iri abụọ n’itoolu nke ọnwa Juun nke afọ a n’Enugwụ were hiwe otu nhazi maka ọgbakọ ukwu kwa afọ ha nke a ga-eme n’Enugwu.

Hon Ndubuisi Eneh bụ onye a kpọlitere dịka onyeisioche otu nhazi Ọgbakọ ụkwụ ahụ akpọrọ “Coal City Homecoming 2019” n’ihi na ọ bụ n’Enugwu Steeti ka a nọrọ hiwe otu a bụ ANA. Ndị otu ya gụnyere renowned Poet, Oriakụ Chinemerem Anyi (odeakwụkwọ), Ọkaiwu Ugochukwu Agballa (onye zọbuworo ọkwa dịka Gọvanọ n’Enugwu Steeti ), Sir Gregory Adiakosa (Osote onye nlekọta na-ahụ maka mmemme n’ụlọ mgbasa ozi FRCN Enugwu), Dọkịnta Oriakụ Ojel Anidi(onye nkụzi na mahadum Institute of Management and Technology (IMT), Enugwu, Mazi Greg Mbajiogu (onye nkụzi na mahadum Naijiria dị na Nsụka), Oriakụ May Ezeudu(onye bụbu odeakwụkwọ mgbasa ozi ANA, ngalaba nke Enugwu Steeti, Mazi Chike Nwaka (onye rụburu n’ụlọ ọrụ FRSC) tinyekwara Mazi Sunday Ogbonna (onye jibu ọkwa dịka odeakwụkwọ ANA, ngalaba Enugwu Steeti)

Ọ bụ n’ụlọ ezumezu ndị nlekọta mahadum ndị nkuzi bụ ATCOI College of Education, Enugwu, Enugwu Steeti ka a nọrọ mee ya bụ mmemme. Ọgbakọ ụkwụ kwa afọ a ga-eme n’Enugwu ga-abụ nke iri atọ n’asatọ nke ANA.

Ihe ndị pụtara ihe na mmemme ahụ gụnyere mkpughepu aha a bara ọgbakọ ukwu a nakwa inyefe akwụkwọ ikike ile ọbịa nke onyeisi ANA nyere onyeisi oche otu ahụ n’Enugwu Steeti bụ Mazi Zulu Ofoelue. E nwekwara ngosipụta akụkọ ifo nakwa ngụpụta edemede nke Ọkaiwu Ugo Agballa mere.

N’okwu ya, Zulu Ofolue,Onyeisi oche ANA Enugwu Steeti kwere ndị ANA nọ na Naijiria gbaa gburugburu n’ọgbakọ ukwu nkea a ga-eme n’Enugwu ga-abụ eji amatụ.

Onyeisi ANA na Naijiria bụ Mallam Denja Abdulahi kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-enye ANA Enugu nkwado zuru oke iji mee ka
ya bụ ọgbakọ ụkwụ bụrụ nke gara nke ọma

Leave a Reply

Your email address will not be published.