Enugwu: Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyịchukwu Ugwuanyị ekwela ndị ọma ndị Enugwu Steeti nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ eleghị anya n’azụ ịhụ na Hotel Presidential, Enugwu bịaghachitere ọzọ. Ugwuanyị kwupụtara nkea ụbọchị Tọọzdee  abalị iri n’asatọ nke ọnwa a mgbe ọ gara njem ijiri anya ya wereRead More →

Arụ gbaa afọ, ọ bụrụ omenala. Ikekwa ya mere o ji hịa ndị mmadụ ahụ ịkụrụ Aka na-achị Ọyọ Steeti bụ Mazị Seyi Makinde aka maka igbasa ozi banyere Nkwupụta Akụnụba ya. Ọ bụrụ na Naịjiriya bụ obodo ndị ihere ime ihe ọjọọ na-eme, e kwesịrị ibuputa ma ịgba, maRead More →

Enugwu: Ndi oji egbe madụ anọ kpuchiri ihu nọrọ n’oge o jiri ọkara gata elekere abụọ nke ehihie ụnyahụ bụ Tọọzdee, abalị iri n’asatọ nke ọnwa Julayị were gbaa ụkọchukwu ndị Katọliki egbe n’ụzọ si Nomeh dị n’okpuru ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Nkanụ aga Nenwe dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’Enugwu Steeti.Read More →

Abụja: Ebeanọ Dọkịnta Chimaroke Ogbonnịa Nnamani, Gọvanọ chịburu Enugwu Steeti ga-anọ kpọm kwem na ngosipụta Oka Okoro, ejije Nollywood pụrụ iche fọzịrị abalị asatọ. Ngosipụta ejije nkeji otu narị n’iri abụọ a nke ga-enye ndị ọbụla omenala Igbo na-amasị obi ụtọ ga abụ n’ụlọ nkiri onyonyoo Genesis Cinema dị  n’ụzọRead More →

Legọs : Yul Edochie esoghị na ndị eri agọ. N’ozi ịtụ mma o zigara omebe ejije ibe ya bụ Nọnso Diobi na Ncheta Ọmụmụ ya n’ụbọchị Tọọzdee, abalị iri n’asatọ nke ọnwa a n’instagram, o toro Diobi maka izi ya ụzọ mgbe ọ bịara Legọs ọhụrụ. “N’agbata afọ 2005 naRead More →

Onyeisiala Naịjiriya n’oge gara aga, Olusegun Ọbasanjọ na Muhammadu Buharị, onyeisiala Naijiriya na-agbakọrịta egbe ọnụ maka akwụkwọ ozi Ọbasanjọ degaara  Buharị. N’akwụkwọ ozi nke abụọ a, Onye amụma Ọbasanjọ degaara Onye eze Buharị, ọ na-enye ya ndụmọdụ ka o wepụ aka enwe n’ofe iji mee ka agha ghara ịda n’obodoRead More →

Enugwu: Ndi ìsì karịrị otu narị si ụlọ akwụkwọ ndị ìsì dị n’Oji River bụ Oji River School for the Blind anọchiwo ụzọ awara awara ochie si Enugwu gaa Ọka. Ha na-eme ngagharị iwe maka oke ụgwọ ụlọ ọrụ na-ekesa ọkụ bụ Enugu Electricity Distribution Company, EEDC na-amagbunye ha. ỤmụRead More →

Abụja: Ichie Paul Unongo bụbu Onyeisioche otu Northern Elder’s Forum, NEF, ekwuola hoo!haa! na onye ugwu kagaaachịkwa ma Onyeisi ala Muhammadu Buhari rituo n’afọ 2023. Ọ sị na ha ndi Ugwu ga-atọ n’ọchịchị maka oke ụbara ọnụ Ọgụgụ ha,na ọ dịghị njọ bụ ndị Ugwu ịzọ ọkwa onyeisiala ma BuhariRead More →

Abụja: Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ, Onye Nchịkwa(Chief Whip) otu ndọrọndọrọ APC na Sineti Naịjiriya ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Abịa Steeti ekwupụtawo hoo!haa! na ọ bụ ya webatara Ruga n’Ala-Igbo. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ Sineti n’Abụja n’ụbọchị Tọọzdee gara aga bụ abalị iri n’otu nke ọnwa a. “Mgbe mRead More →

Aba: Ihe na-eme n’Aba. Ndị Aba bụ ndị kajara akaja. Ha bụ ndị nwere ọgụgụ isi eji arụpụta akara gwa ọhụrụ. Ajọ ụzọ nakwa ihe isi ike ndị ọzọ juputara n’Aba agaghị eme ka ndị Aba gharakwa ịbụ ndị nka n’ụzụ dị n’obara kama ọ mere ndị Aba nwezia ucheRead More →

Chai! Nsogbu dị! Oriakụ Hauwa Suntai, nwunye Gọvanọ Danbaba Suntai chịburu Taraba Steeti lagoro mụọ ka añụrị na-egboziri akamụ maka na ọ lụghariwo di ọzọ. Ihe dịzị egwu bụ na onye ọ na-alụ ya bụ nwokorọbịa bụbu Onye Inyeaka (PA) di ya nwụrụ anwụ mgbe ọ bụ Gọvanọ. Nwokorọbịa aRead More →

  Abuja: Owele Anayọ Rochas Okorọcha, Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Ọ̀lụ̀ ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Imo Steeti nọ taa n’ọgbakọ izugbe sineti were kpọọ oku ka Gọọmenti Etiti Naịjiriya kepụta Mịnịstrị na-ahụ maka Mkpori Ndụ iji belata oke ọnụ ọgụgụ akwụm ụdọ jupụtara n’ala anyị taa. Sinetọ kwenyere na iheRead More →

Legọs: Rilwan Akiolu, Ọba Legọs, ekwuola na  Olusegun Ọbasanjọ, onye bụbu onyeisi ala Naịjiriya bụ ya bụ nsogbu Naịjiriya nwere. Akiolu tiwara akị oyibo Nsugbe a oge ọ na-ekwu okwu na Ngosipụta akwụkwọ ọhụrụ nke a kpọrọ “Battlelines: Adventures in Journalism and Politics’, n’olu bekee nke Segun Osoba, Gọvanọ chiburuRead More →