ỌJỊ ỤZỌ, HAPỤRỤ ANYỊ ALA ANYỊ – NDỊ NKPORO

Spread the love

 

ỤMỤAHỊA: Ndị Elughu Nkporo dị n’okpuru Ọchịchị Bende n’Abia arịọla Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ to sepụ aka n’ala ha nke ọ chọrọ ka e nye maka Ruga (ama ndị Fulani).

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị obodo ahụ na-ebo Sinetọ Kalụ, onye bụbu Gọvanọ Abia steeti ebubo na ya ndị be ha ụfọdụ chọrọ inye ndị Fulani ala ha maka Ruga.

N’okwu ya, otu onye ndu ndi ntorobịa n’obodo ahụ, Ndukwe Ọbasị kwuru sị : “Ọjị Ụzọ nwere ike iwere ala Igbere nile nye maka Ruga ma ya hapụrụ anyị ala anyị.”

“O nyewo ha ala n’Igbere maka ọ bụ ya nwe ọtụtụ ehi dị n’Igbere. Ya mata na ndị okenye ma ọ bụ ndị ọbụla natara ya Nde Naira iri ise (N 50million) na ego ahụ efuola maka na anyị achọghị Ruga na Nkporo tupu ihe na-ada na Benue ebido dawa na be anyị”

Mazi Ọbasị sịkwa na Sinetọ Kalụ na-achakwa otu onye eze n’Alayị ọkụ ka ọ nara ego ma nye ala maka Ruga.

Ozi anyị nwetakwara bụ na ndị Uturu na-akwadokwa ka ha na nwa ha bụ Dọkịnta Uche Ọga chịpụ ya maka mbọ ọ na-agba iwebata ha Ruga.

hoo!haa!! na-ajụzị sị :”Kedụ ihe mere na ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na ndị aka ji akụ e nwere n’ala-Igbo enweghị ike ijikọ aka ọnụ were rụọ ogige nche ehi na steeti dị iche iche n’onwe ha na echewehi ndị Fulani ebe Gọọmenti Etiti kwuworo hoo!haa!! na Ruga abụghị sọọsọ maka ndị Fulani kama na ọ bụ maka ndị ọbụla nwere mmasị ịkpa ehi.?

Leave a Reply

Your email address will not be published.