ỌGBAGHARA, GBAJABIAMILA ZỌRỌ ONWE YA AZỌ TAA

Spread the love

 

 

Abụja: Ọgbaghara dapụtara taa bụ abalị atọ nke ọnwa Julaị n’ọgbakọ ụlọ nzukọ omebeiwu ala anyị nke nta.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ ụlọ nzukọ bụ Femi Gbajabiamilia kwuru na ya natara akwụkwọ ozi n’aka ndị otu ha na anọghị n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị nke ọ chọrọ ịgụpụta.

Kaosiladi, Mazi Kingsley Chinda,nke otu PDP, weliri aka ịkagbụ ihe ọ chọrọ ịgụputa mana Ọnụ na-ekwuru ụlọ nzukọ ahụ enyeghị ya ohere ikwu okwu.

Nkea buteziri ụzụ n’ọgbaghara ebe ọtụtụ ndị PDP ekweghị enye ya ohere ịgụputa ya bụ akwụkwọ ozi.

Ndị nche ụlọ nzukọ (sargeants-at-arms) gbara ọsọ ga chekwaa ọkọrọtọ nzukọ ebe Gbajabiamila jizi ọsọ Yigharị ọgbakọ ahụ.

Ndị PDP nọ n’ụlọ nzukọ ahụ kere ụzọ abụọ ebe ha abụọ nwere ndi ha kpọlitere ka ha nochite ha n’ọchịchị ụlọ nzukọ ahụ.

Nkea buteziri ndị nkwe na ndị ekweghị nke meziri otu ụzọ n’ime jiri fọrọ ntụtụ taa  na-agaghị agụpụta ya bụ akwụkwọ ozi.

E chekwazịrị ọnụ na-ekwuru ụlọ nzukọ echekwa were dupu ya ebe ụfọdụ na-akwa ya emu ma ndị ọzọ na-àjà ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.