APGA:NSOGBU OYE KARỊZỊRỊ

Spread the love

Ọzọ Victor Oye, Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA nọzị na nnukwute nsogbu ugbua.

Ụlọikpe ukwu nke Delta Steeti mpaghara nke Kwale nọrọ taa bu abalị anọ nke ọnwa Julayị kagbuo nhọpụta nke APGA mere n’abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Mee ma chutukwaa ya na ndi otu ya n’ọkwa.

Ọkaikpe Vincent Ofesi kwubiri na nzukọ ukwu ndị ọchịchị APGA e mere n’abalị iri n’anọ nke ọnwa Mee, tinyekwara ihe ndị ọzọ sitere na ya bụ nzukọ bụ ihe efu.

Mana nke ka njọ bụzi ozi hoo!haa!! na-enweta na ndị nile na-ebo Ọzọ Oye ebubo iri ego ha mgbe ha pụtara izọ ọkwa n’okpuru APGA na – akwado ime ngagharị iwe n’ọkwá, isi obodo Anambara Steeti

Comrade Ikechukwu Chukwunyere,onye nke a jụrụ ịgbanye akwụkwọ azọm ọkwa iji zọ ọkwa onye isi oche APGA n’ala anyị n’agbanyeghị ụgwọ Narị puku Naira iri abụọ n’ise (N250, 000) ọ kwụnyere n’ụlọ akụ bụ ya na-achịkọba ya bụ ngagharị iwe nke ebumnuche ya bụ ime ka Gọvanọ Willie Obianọ bụ onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA manye Oye amanye ka ọ rituo n’ọkwa.

Ka nkea na-akpọtụ, ụfọdụ ndị pụtaburu iji aha APGA were zọọ ọkwa Gọvanọ n’Imo Steeti na nhọpụta gara aga edegaworo ụlọ ọrụ EFCC akwụkwọ mkpesa maka ebubo ha na-ebo Ọzọ Oye na o gwunarịrị ha ọkpụrụkpụ ego gbara abụba n’otu n’otu iji hụ na ha tụụrụ ugo na  họpụta ime ụlọ maka ya bụ nhọputa. Otu onye n’ime bụkwa onye chịbuworo Imo Steeti bụ Dọkịnta Ikedi Ọhakịm.
Ozi anyị nwetakwara na onye nyefere Oye ọchịchị n’aka dịka onyeisioche APGA n’ala anyị bụ Sinetọ Victor Ume sozi na ndi chọrọ ichutu ya n’ọkwa maka ajọ aha ha sịrị na ọ na-ebutere APGA.
hoo!haa!! hụkwara akwụkwọ ozi nke Sinetọ Ume zigaara Gọvanọ Obiano iji gwa ya ka ọ tinye ọnụ na ya bụ ebubo igwunarị ndị mmadụ ego ha  a na – ebo Oye.
Nchọpụta hoo!haa!! gosikwara na ọtụtụ ndị na-àkwàdobu APGA na abụghị ndị Anambara Steeti jizi iwe apụsị maka na ha sị na APGA ghọziri ihe sọọsọ ndị Anambra ebe Victor Ume chịchara nyefee ọchịchị n’aka onye Anambara ọzọ

Leave a Reply

Your email address will not be published.