MGBUKASIAHỤ(TATTOO) ABỤ ISI MMEBI?

Spread the love

MGBUKASIAHỤ abụ isi mmebi? Ihe butere ajụjụ a bụ na ndị Uwe Ojii ala Naịjiriya ekwuola hoo!haa!! na ha agụpụwo ndị bu mgbukasịahụ na ndi isi mmebi na ndị ha agaghị enye ohere isonye na ewemnọrụ ha na-aga n’ihu ugbua.

Ihe a bụ ajụjụ juru ọhaneze n’ọnụ kemgbe ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii n’Enugwu Steeti bụ Ebere Amaraizu, onye ji ọkwa superintendent, gbachara ama a n’izu ụka gara aga ka ọ na-ekwu okwu maka nlele ahụ a na-eme ndị chọrọ ịba ọrụ uwe ojii n’Enugwu Steeti.

Tupu nkea, Mazị Emmanuel Inyang, onye ji ọkwa dịka Osote onye Nchịkọta ndị Uwe ojii Naịjiriya na-ahụ maka ọzụzụ (DIG, Training) nọkwara n’ụbọchị Fraịdee, abalị iri nke ọnwa Mee mekwaa ka o doo anya na ndị Uwe ojii ga-achụte ndị ọbụla bu mgbukasịahụ nakwa ndị otu nzuzo aka n’ewemnọrụ ha.

Inyang kọwara na nkea bụ iji gbochi ndi nwere akparamagwa a na-enyo enyo, ọ kacha ndị otu nzuzo ịmịbata n’ọrụ ndị Uwe ojii.

“Ndị Uwe ojii ga-agba mbọ ịhụ na ndị bu mgbukasịahụ esoghị na ndị bịara dịka ndị anamachọọrụ maka na anyị achọghị iwe ndị otu nzuzo n’ọrụ uwe ojii.

hoo!haa!! na-ajụzị sị : o nwere uru dị na igbu mgbukasịahụ? Ọzọkwa, mgbukasịahụ a bụ isi mmebi? Nke ikpeazụ, gịnị jikọrọ mgbukasịahụ, otu nzuzo nakwa isi mmebi?

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.