RUGA:MBA, MMIRI KA RIVAS GA-EZIGANWURU UNU-WIKE

Spread the love

PORT HARCOURT: Ezebunwo Nyesom Wike, aka na-achị Rivas Steeti ekwuola hoo!haa!! na-enweghị ihe ọbụla gbasara steeti ahụ n’akụkọ a na-akọ maka Ruga n’ihi na aka ya agaghịkwa adị n’ọba e kere ede.

Wike kwuru nkea taa bụ abalị ise nke ọnwa Julaị

oge ọ na-etinye ọnụ n’okwu banyere atụmatụ Gọọmenti Etiti nke bụ ịrụ Ruga (ama Fulani) na steeti nile nọ n’ala anyị maka ndị nchị ehi ndị Fulani.

N’iga n’ihu n’okwu ya, Wike kwuru sị :”Ebe anyị na-esi ebea zigara mmanụ agbidi n’okporo mmanụ anyị nwekwara ike si otu a zigara ha mmiri site n’Osimiri Bonny gaa be ha ka were kọọ ahịhịa iji zụ ehi ha ”

“Nke a bụ ihe anyị ga-emenwu iji nyere ha aka. Mana ọ bụrụ maka akụkọ ihe ọzọ m’ amaghị aha ya ha na-akọ amaghị maka nke ahụ”

Leave a Reply

Your email address will not be published.