ABỊRỊBA EMEELA MMEMME IRIAMA

Spread the love

Enachoken Eze Kalu Kalu Ogbu (IV) ekwupụtawo mkposa ekposara ndị ọchịchị nọbu n’isi otu Abiriba Communal Improvement Union (ACIU) nke Mazị Eke Agbai nọ n’isi ya.

N’okwu ya n’oge “Itu Eye” nke e mere n’ezi Amaukwu, Amaeke, Abiriba iji merube Mmemme Iriama nke afọ a e mere na ngwucha izu Ụka gara aga, Enachoken bụ nnukwu eze ọdịnala na-achị Abịrịba nile nyeziri ntụziaka ka ndị a nọbụ n’isi na ACIU weghachi ngwo ngwo otu ahụ nile nọ ha n’aka. O kwukwara na-aga akpọlite ndị isi nchere oge maka otu ahụ n’oge na adịghị anya.

Ichie John Okiyi Kalu bụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n’Abia Steeti jikwara ohere ahụ were kelee Aka na-achị Steeti ahụ, Dọkịnta Okezie Ikpeazụ  maka ịnabata Effa nke Agboji Abiriba, Eze Benjamin Uche Agu nakwa Ukpaghari nke Amaogudu Abiriba, Eze Eme Uguru Ikpoka dịka ndị Eze na Steeti ahụ, ma kọwakwaa na Gọvanọ ahụ, onye e chịkwara echichi dịka Ọtuba Okwojie nke Abiriba dị nkwadebe ikwalite udo na mmepe nke obodo ahụ.

E nweziri ngosi omenala dị iche iche e ji mara ndị Abiriba e gosiri ụbọchị ahụ

Abiriba bụ otu obodo nọ n’Ala-Igbo n’anaghị eji omenala ha egwu egwu chaa chaa

Leave a Reply

Your email address will not be published.