FULANI LAA, KA NTOROBỊA ỌHANEZE KPAWA EHI IGBO – OYC

Spread the love

Owere:  Otu ndị ntorobịa Ọhaneze na-aza Ohaneze Youth Council (OYC) ekwuola na ihe ga-ebe okwu banyere nsogbu ndị Fulani na-achị ehi na Ruga ha bụ site na ndi Igbo ibido kpawa ehi Igbo.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyaahụ n’Owere, Imo Steeti, Onyeisi otu a bụ Mazi  Igboayaka O. Igboayaka kwupụtara na oge eruola mgbe ndị ntorobịa Igbo ga-amalite ịchịwa ehi Igbo karịa ịtụkwasị obi ha nile n’ehi Fulani.

“Ọ ka mma na ndị Igbo hapụrụ ehi awụsa bidoro zụwa ehi Igbo nke kakwu atọ ụtọ. Ebe ọ bụ na ndi a ji maka ehi ha ebuso anyị agha, ha chịrị ehi laa ka ndụ fọrọ anyị”

Ọ rịọkwara ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha dọnyere ndị ntorobịa Ọhaneze ụkwụ n’atụmatụ nwa nwere ịmalite ịkpa ehi Igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published.