NCHETA ỌMỤMỤ NEKY

Spread the love

NCHETA ỌMỤMỤ ORIAKỤ NNEKA IBEKWE 
Taa bụ ụbọchị ụka nkwọ abalị asaa nke ọnwa Julayị ka ORIAKỤ NNEKA EDITH IBEKWE na – eme Ncheta Ọmụmụ ya nke iri afọ anọ n’isii ya.

Neky, dịka ndị enyi nakwa ikwu n’ibe si akpọ ya bụ Ada Ekwuluọbịa mana ije di bugara ya Ọgwa, Mbaitoli, Imo Steeti.

Ọ bụkwa onye nkuzi.

Lezie ozi ekele ya: “A na m enye Ọbasị bi n’igwe ekele n’otito n’ihi ndụ nke o nyere mụ nakwa ndi ezinụlọ m.
A na m ekele mmadụ nile ndi nyeere m aka site n’ụbọchị a mụrụ m wee ruo taa.
Ekele m na-agara ndi ezinụlọ a mụrụ m,
ezinụlọ ebe m lụrụ di
nakwa ezinụlọ nke m.
Chineke goziere m ndi enyi m nile tinyekwara ndị otu anyị na hoo!haa!! bụ otu na-akwalite asụsụ Igbo”

1 Comment

  1. Author

    Neky, ka ọñụ bụrụ nke gị na Ncheta Ọmụmụ gị. Hmm, hoo!haa!! dịkwa egwu




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.