RUGA:ADEBOYE, CHEGHARỊA – CHARLI BOY

Spread the love

Legọs: Area Fada Charli Boy Oputa achịrịwo ndị ọzọ iwe dị n’obi gaa ime ngagharị iwe n’ihu ịsị ụlọ ụka ndị Redeemed Christian Church of God iji mee ka Nnukwu Onye Nlekọta nke ụlọ ụka ahụ bụ Ụkọchukwu Enọk Adeboye chegharịa site n’ịgbachite nkịtị ebe arụ na-arịzị ibe ya elu na Naijiriya.

Ochie Dike ọ́gụ́ egwu a duuru ndị otu ya ndị ọzọ ndị na-agụ egwú nakwa ndị mmebi ihe nkiri Nollywood were gaa ya bụ ngagharị iwe.

Ha na-ajụ ihe mere na Adeboye nakwa ndị ụkọchukwu ndị ọzọ nwere agba achọghị ikwu okwu banyere ọbara nile a na-akwafu n’obodo, ọ kacha site n’aka ndị Fulani na-achị ehi.

N’okwu ya, Charli Boy jụrụ sị:”Gịnị mere na Adeboye na ndị ụkọchukwu ndị ọzọ nwere agba achọghị ikwu okwu maka mkpa mkpa ndị Fulani na-achị ehi na – akpazi n’obodo? Ma n’ugwu ma na ndịda tinyekwara mpaghara obi etiti, ihe na-akpọtụ bụ ịtọ̀ mmadụ, ịkwafu ọbara, idina nwanyi n’ike, wdg”

“Gịnị mere ndị ụkọchukwu a agaghị akpọ ihe ọjọọ ihe ọjọọ? Na nsogbu a nile juputara na Naijiriya maka Ruga, ha gbachiri nkịtị”

hoo!haa!! na-ekwu na Adeboye agaghị ejizi na Ọkammụta Yemi Osinbajo, Osote Onyeisi ala bụ ụkọchukwu welitere isi n’ụlọ ụka ya were gba nkịtị dịka okenye ka ewu were mụọ n’ọgbụ

Leave a Reply

Your email address will not be published.