IBERIBERISM:EKWESỊRỊ INWE MỊNỊSTRỊ ETITI MAKA MKPORI NDỤ

Spread the love

 

Abuja: Owele Anayọ Rochas Okorọcha, Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Ọ̀lụ̀ ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Imo Steeti nọ taa n’ọgbakọ izugbe sineti were kpọọ oku ka Gọọmenti Etiti Naịjiriya kepụta Mịnịstrị na-ahụ maka Mkpori Ndụ iji belata oke ọnụ ọgụgụ akwụm ụdọ jupụtara n’ala anyị taa.

Sinetọ kwenyere na ihe ndị otu ya ndị ọzọ kwuru na oke ụbịam karịzịrị n’obodo so akpata ajọ ọnọdụ a.

Ọ dụrụ Sineti ọdụ ka ọ kpọkuo Gọọmenti Etiti ka o kelhupụta Mịnịstrị maka Mkpori Ndụ dịka o siri mee n’Imo Steeti.

“Obi adịghị ọtụtụ ụmụ amaala Naịjiriya mma, ala anyị jupụtara na ndị iwe ji. Ọtụtụ na-akwụgbuzi onwe ha maka na ha enweghị ike ikwupụta ihe na-anyịgbu ha n’obi”

“Gọọmenti ọbụla na-emenwughi ka ndị mmadụ na-ekpori ndụ adaala n’ọrụ ya.

“E chere m na-aga enwelata ngalaba maka Mkpori Ndụ. Mgbe m kepụtara ya, ndị mmadụ ghọtahiere m, mana ọ bara oke uru.

Kaosiladi, ka ya bụ Gọvanọ chịburu Imo Steeti  onye nke mere ka “IBERIBERISM” banye na nkọwa okwu bekee kpọchara oku ahụ o nwetaghi nkwado ọbụla chaa chaa nke meziri ka ya bụ okwu ya daa mmiri.

hoo!haa!! na-ajụzị sị :”Ndigbo, gịnị ka anyị ji isi kote? Ọ bụ na nwa mgbeke amaghị akpụ ka ọ bụ na agụba adịghị nkọ? Keduzi ka Sinetọ Rochas ga-esi lechaa nsogbu nile juputara obodo, ọkacha nsogbu ndị Fulani na-achị ehi ọ bụrụ ikepụta Mịnịstrị Mkpori Ndụ ka ya mkpa?

Leave a Reply

Your email address will not be published.