ỌBASANJỌ BỤ ONYE ARỤRỤ ALA NA NSOGBU NAỊJIRIYA-AKIOLU

Spread the love

Legọs: Rilwan Akiolu, Ọba Legọs, ekwuola na  Olusegun Ọbasanjọ, onye bụbu onyeisi ala Naịjiriya bụ ya bụ nsogbu Naịjiriya nwere.

Akiolu tiwara akị oyibo Nsugbe a oge ọ na-ekwu okwu na Ngosipụta akwụkwọ ọhụrụ nke a kpọrọ “Battlelines: Adventures in Journalism and Politics’, n’olu bekee nke Segun Osoba, Gọvanọ chiburu Ogun Steeti dere.

Ọba Legọs na – ekwu maka arụrụ ala Ọbasanjọ rụsara ndị Gọvanọ mpaghara Ọdịda Anyanwụ ndị nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Alliance for Democracy (AD) oge ya bụ Ọbasanjọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) n’afọ 2003.

N’ikwu maka ihe Osoba dere n’akwụkwọ ahụ ebe ọ na-ekwu na Ọbasanjọ ghọgburu ha bụ ndị Gọvanọ, Akiolu kwuru na ya mabu Ọbasanjọ dịka “onye arụrụ ala”

Ọ kwukwara na obi dị ya ụtọ na Bola Tinubu esoghị dabanye n’ọnya Ọbasanjọ nke mere o ji were nwetanwuo nhọpụta nke ugboro abụọ.

N’okwu nke ya, Bola Tinubu, bụ Gọvanọ chiburu Legọs Steeti nyere ndị Naijiria ndụmọdụ ka onye ọbụla gbawa mbọ maka idinotu ala a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.