CHAI! NWUNYE SUNTAI NA-ALỤZI NWA ỌRỤ (PA) DI YA

Spread the love

Chai! Nsogbu dị! Oriakụ Hauwa Suntai, nwunye Gọvanọ Danbaba Suntai chịburu Taraba Steeti lagoro mụọ ka añụrị na-egboziri akamụ maka na ọ lụghariwo di ọzọ.

Ihe dịzị egwu bụ na onye ọ na-alụ ya bụ nwokorọbịa bụbu Onye Inyeaka (PA) di ya nwụrụ anwụ mgbe ọ bụ Gọvanọ.

Nwokorọbịa a bụ Haliru Saad Malami (San Turakin Malumfashi) nọ n’agbata iri afọ atọ dịrị gawa (30s) ebe Hauwa nọ n’agbata iri afọ ise dịrị gawa (50s).

Danbaba Suntai nwụrụ n’afọ 2017 site na mmerụ ahụ o nwetara mgbe ụgbọelu ọ nya n’onwe ya nwere ihe mberede.

Malami n’onwe ya bụkwa nwa nwanne Ajịya Turai Yar ‘adua, nwunye onyeisiala Naịjiriya lagoro mụọ.

Ha nọrọ n’ụlọ ekpere alakụba ukwu dị n’Abuja were gbaa akwụkwọ na Satọdee gara aga  bụ abalị asaa nke ọnwa a.

Hmm, ọ dịkwaghị mma “nwodibo iri nri nna ya ukwu, ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ” 

Leave a Reply

Your email address will not be published.