BUHARỊ, KWỤỌ M’ ỤGWỌ M-ADUKU, SOJA DỊ AFỌ NARỊ N’ỤMA

Spread the love

Legọs :Adama Aduku, ochie DIKE dị afọ narị n’iri n’anọ soro lụọ ọgụ agha mbaụwa nke abụọ (World War II) nọrọ na Satọdee gara aga were rịọ ọchịchị Onyeisi ala Muhammadu Buhari ka a kwụọ ya ụgwọ ezumike nka eji ya kemgbe afọ 1957 ọ lara ezumike  nka.

Aduku kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ka ọ natachara onyinye nturu ugo nke Ọchịagha Ụsụụ ndị agha Naịjiriya maka ndị ochie dike agha mba ụwa (Chief of Army Staff World War II Veterans Award nke abụọ) na Legọs.

“A banyere m Royal West African Frontier Force n’afọ 1942 na Makurdi, Benuwe Steeti. E soro m lụọ ọgụ na Calcutta, India n’agha mba ụwa nke abụọ.

“A laghachitere m Legọs n’afọ 1946 ma nọrọkwa na ngalaba ụsụụ ndị agha 4 Brigade Guard  tupu m hapụ ọrụ soja n’afọ ahụ.

”A lachitekwara m azụ n’ọrụ ndị Agha mba Naịjiriya n’afọ 1957 na Zaria tupu m were lazịa ezumike nka n’afọ 1957.

“A bụzị m onye ọrụ ugbo n’obodo m bụ Abejukolo dị n’okpuru ọchịchị Omala na Kogi Steeti.

“Kemgbe ahụ , a kwụbeghi m ụgwọ ezumike nka m ruo taa”

Leave a Reply

Your email address will not be published.