ANYỊ TỌRỌ ATỌ – NDỊ AKIYI-ỤMỤLỌKPA

Spread the love

 

Enugwu: Ndị Akiyi-Umulokpa dị n’okpuru Ọchịchị Ụzọ Ụwanị nke Enugu Steeti etiwo mkpu enyemaka tigara Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị nke Enugwu Steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka site na ịrụzi ogwe dara ada  na be ha nke kewapụrụ ha na obodo ndị ọzọ ha na ha gbara agbatobi kemgbe afọ asaa.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ogwe ahụ dara kemgbe afọ 2012 mgbe onye bụ onyeisi oche Okpuru Ọchịchị ahụ oge ahụ bụ Mazi Cornel Ọnwụbụya na-achọ ịrụ ụzọ ọzọ ga-ejikọ Ụmụlọkpa nakwa Olo dị n’Okpuru Ọchịchị Ezeagụ nke Enugwu Steeti.

N’okwu ya, otu onye obodo ahụ bụ Mazị Tony Madubuike, kwara arịrị ma jụkwaa ihe kpatara Gọọmenti ji kpakụtazịa ha azụ n’agbanyeghị na Ụmụlọkpa bụ otu n’ime isi obodo okpuru ọchịchị ochie e nwere n’Anambara Steeti ochie.

Ndị obodo ahụ na-ekwukwa na ndị ohi jizi ohere ụzọ n’adịghị mma were awakpo ndị be ha maka na oke ọhịa tochiziri ụzọ gawara ogwe ahụ.

hoo! haa!! na-ajụzị sị :”Gịnị mere na Mazị Ọnwụbụya bụ onyeisi oche okpuru ọchịchị ahụ mgbe ogwe ahụ gbajiri arụzighi ya ebe ọ bụkwu onye obodo ahụ?”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.