“Ọ MỤ WETARA RUGA N’ALA-IGBO” – ỌJỊ ỤZỌ KALỤ

Spread the love

Abụja: Sinetọ Ọjị Ụzọ Kalụ, Onye Nchịkwa(Chief Whip) otu ndọrọndọrọ APC na Sineti Naịjiriya ma bụrụkwa Gọvanọ chịburu Abịa Steeti ekwupụtawo hoo!haa! na ọ bụ ya webatara Ruga n’Ala-Igbo.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ Sineti n’Abụja n’ụbọchị Tọọzdee gara aga bụ abalị iri n’otu nke ọnwa a.

“Mgbe m bụ Gọvanọ, a kpọrọ m onyeisi ndị Miyetti Allah n’Abia Steeti ga zi ha ebe ha na ebute ma na-akpazị ehi ha. Nke mgbe ahụ  nsogbu lara.

” E nwekwara m ọtụtụ ehi m na-akpa. Ego dị n”ịkpa ehi, ọ bụghịkwanụ sọọsọ Fulani na-akpa ehi.

Ọjị Ụzọ kọwakwara na atụmatụ Ruga amaka, na o nweghị ihe dị njọ na ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.