TỤFỊAKWA! ỌKAIKPE UKWU (CJN) ITIBỌRỊBỌ

Spread the love

Abụja: Nsogbu Ọkaikpe Ukwu Naịjiriya, Muhammad Tanko dịkwa ka ọ karịrị akarị. A ka na-ekwu na ọ wuru onwe ya n’ala n’ajụjụ nnyocha ndị Sineti gbara ya, ọ na-akọzi na akịka tara asambodo ụlọ akwụkwọ praịmarị ya.

Tanko kwupụtara nkea n’ime iyi ụlọikpe ọ ñụrụ n’Ụlọikpe Mkpegharị dị na Jọs, Plaatu Steeti.

Tanko sịrị na akịka nọrọ n’abalị iri n’ise nke ọnwa Maachị, afọ 1998 were taa asambodo ụlọ akwụkwọ praịmarị n’obodo ya bụ Doguwa/Giade nke ngalaba agụmakwụkwọ okpuru ọchịchị Katagun Jama’are nyere ya ma mebikwaa ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ.

Nke ka nke bụ na asambodo Ule akwụkwọ WASC o jiri banye mahadum gosiri na ọ deghịdi ma Maths ma Inglishi ma ya fọdụzịa inweta ha.

Ugbua ka a chọpụtara ihe mere na ọ maghị ihe bụ “technicality”, bekee ụmụ akwụkwọ mahadum nọ na ngalaba Iwu ji ekwe ukwe.

hoo!haa!! na-ajụzi, “Ọ bụrụ na nwoke a enweghị asambodo ndị ọ kwesịrị inwe, ọ ziri ezi na ọ ka ga-abụ Ọkaikpe Ukwu Naịjiriya? Ihere anaghị eme onye ara mana ọ na-eme nwanne ya. Ihere ndị Ugwu na-emezi anyị maka ndị itibọribọ na-esi be ha apụta.

Leave a Reply

Your email address will not be published.