NDỊ NCHE FULANI:AKEREDOLU, Ị BỤ ONYE ARA? – OPC

Spread the love

Legọs: Otu Oodua Peoples Congress (OPC) nakwa otu ndị ọzọ nọ n’ala Yoruba ajụọla Aka na-achị Ondo Steeti, Rotimi Akeredolu ma ọ bụ onye ara kpatara o ji hapụ ndi Fulani ha were hiwe ndị nche (vigilante) na steeti ahụ.

N’ozi nke otu iri abụọ n’atọ wepụtara ụbọchị Tuuzdee, abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Julayị ha kọwara ihe a Akeredolu mere dịka “oke ichu aha” nyere omenala ndị họpụtara ya ka ọ chịwa ha.

Ha sịkwara na ọ bụrụ na Akeredolu ekposaghị ndị nche Fulani ahụ n’ime otu ụbọchị, na otu ndị Yoruba si akụkụ nile ga-abịa Ondo Steeti bịa luso ndị Fulani ahụ ọgụ.

O teela anyị diwere ndị osu imi, mana nke a karịzịrị, ọ ka mma ịnwụ karịa ịbụ ohu, ”

Ndị tinyere aka  n’ozi a gụnyere Ọtunba Gani Adams, Ichie Hakeem Salau Akinremi nakwa Col Abimbola Sowunmi(laworo ezumike) n’aha otu iri abụọ n’atọ ndị ahụ.

Otu ndị ahụ gụnyere O’odua Peoples Congress, (OPC), Network of O’odua Alliance, (NENA), O’odua Revolutionary Congress, (ORC), Agbekoya, O’odua Students Revolutionary Council, (OSRC), Yoruba Radical Alliance, (YORA), Apapo O’odua Koya (AOKOYA), O’odua Progressives Congress, (OPOC), Okun Revolutionary Movement, (ORM), wdg.

OTU ndị ahụ kwuru sị: “Gị, Gọvanọ Ondo Steeti bụ ihe ihere nye ndị Yoruba

Anyị nụburu na ị na-achịkọba ndị nche Fulani chee na ọ bụ njakịrị.

Kedu ka ị ga-esi kpọta ndị na-emebi obodo mee ha ndị nche?

Ị bụ onye ara? I makwara banyere agụgụala (history)?

Ha gwazịrị ndị Yoruba nọ n’ụwa nile ka ha hụwa Akeredolu n’ezinụlọ ya ama dịka ndị iro ndị Yoruba pụtara ìhè ma werekwa ha ka ndị a jụrụ ajụ.

 

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.