DEE DONA ANAALA NWANNAA BORI AKA

Spread the love

Dee Dona anaala Nwannaa Bori aka na nhọpụta ya dịka Onyeisiala mba Briteenụ.

Ha abụọ dịka “ọ tọrọ onye n’onye”. A jụọ ase ọfụma, o nwere ike bụrụ na otu nne mụrụ ha abụọ.

Ya bụ na Dona ñụfọọrọ Bori ara. Ha abụọ bụ ndị azụ anụ ụka, ndị a na-ekwu  nke o mere, o mee ọzọ, ndị ya kpọtụba, ndị ọbata osu, ndị ikwatụ m, ma akwatụ gị, ndị asị ka a chaa a chaa, asị ka akụwasịa, akụwasịa, wdg.

Nke ka nke bụ na ihe dị ụmụ nwanyị n’ahụ na-adị ha abụọ mma  n’ahụ. Ha bụ ndị oringo

E chetakwa m egwu e ji ekpori ndụ n’ogbe: “Onye na-eme ka m si eme, ya ka m ga-akpọ ọyị mooooo! Ọyị m ọma!”

Leave a Reply

Your email address will not be published.