ỤGWỌ NA-AGBAKA ISI:ATỤỌLA NDỊ NLEKỌTA EEDC ABỤỌ NGA

Spread the love

Onịcha: Ụlọikpe Anambra Steeti, Ọnịcha nọ ụbọchị Tuuzdee, abalị iri abụọ n’atọ were tụọ Onye Nlekọta (Manager) nakwa Onye Nlekọta Azụmahịa nke ụlọ ọrụ EEDC ngalaba Ọnịcha nga ọnwa atọ maka ịmagbunye ndị ahịa ha ụgwọ na-agbaka isi

Ndị kpụgara ha ụlọikpe bụ  ndị isi otu ahịa Iweka Electronic Amalgamated Traders Association, Ọnịcha maka iwepu ọkụ  ha ka ha magbunyechara ha ụgwọ ọkụ dị Nde Naira Abụọ na-esiteghi n’ìgwè  mgbakọ ọkụ (metre) ha.

N’agbanyeghị na ụlọikpe ahụ nọrọ n’abalị iri abụọ n’atọ nke ọnwa Mee, afọ 2016, were nye ntụziaka ịmachị ndị EEDC iwepụ ọkụ ha, ndị EEDC nupuru isi.

Na mkpebi ya,  Ọkaikpe Ike Obu kọwara omume ndị nlekọta EEDC dịka ejighị iwu kpọrọ ihe.

O kwuru sị, “A tụọla unu nga ọnwa atọ ka unu were mụta isọpụrụ iwu”

Ndị ahịa ahụ malitere ịgba egwu nakwa inwe ọñụ ozigbo ha nụrụ mkpebi ụlọikpe ahụ.

Onyeisi oche ahịa ahụ, Mazị Ndubuisi Egotanwa toro ụlọikpe ahụ.

“O teela ndị EEDC ji eme na ha bụ  “ọdara iwu eje nga”

Leave a Reply

Your email address will not be published.