RUGA:O NWEGHỊ ONYE APC GA-EKWE NYE ALA NNA YA-ỌNỌNUJU

Spread the love

Abụja : Dọkịnta Kachi Ọnọnuju, Otu onye n’ime ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP ekwuola na o nweghị onye n’ime ndị isi APC ga-ekwe nye ala nna ya maka Ruga.

O kwuru nkea oge ọ na-ekwu uche ya n’ụtụtụ Fraịdee, abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julayị afọ a na mmemme ụlọ mgbasa ozi Silverbird TV bụ News Hub.

Site n’okwu ya, Onyeisiala Muhammadu Buhari anaghị agwa ndị Naịjirịa eziokwu.

O kwuru sị, “Mgbe Buhari batara n’ọchịchị, ọ sịrị na ọ nweghị onye nwe ya na mmadụ nile nwekwa ya. Ugbua, o doro anya na ihe gbasara ndị Naịjirịa ọ na-achị agbasaghị ya. Ihe gbasara bụ sọọsọ ihe gbasara ndị agbụrụ ya.

Ọ kọwakwara na okwu banyere Ruga abụghị okwu maka PDP ma ọ bụ APC kama, o metụtara madụ nile.

“Okwu Ruga abụghị atụmatụ APC. Ọtụtụ ndị APC achọghịkwa ya. O nweghị onye n’ike ndị isi APC ga-ekwe nye ala nna ya maka Ruga”

Ọnọnuju katọkwara etu Buhari si agba mbọ iwere ala ndị mmadụ nye ndị Fulani si mba ọzọ site n’atụmatu dị iche iche.

“Kedụ ihe mere Buhari ji esi ọnwụ iwere ala ndị mmadụ nye ndị Fulani si mba ọzọ? A kwụsị Cattle Colony, o bido Ruga, ndị Naịjirịa jụ Ruga, o bulite atụmatụ Gọọmenti Etiti ị weghara ikpere mmiri nile iji nye ya ndị a si mba ọzọ”

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.