EDO:AMALITEWO ỊSỤCHA ỤZỌ N’OKE ỌHỊA MAKA NDI NTỌ

Spread the love
  • Bini: Gọọmenti Edo Steeti amalitewo ịsụcha ụzọ n’oke ọhịa dị n’ụzọ awara awara si Bini gaa Ore.

Nkea bụ iji nyere ndị Uwe ojii aka n’agha ha na-ebuso ndị  ntọ ndị bi n’oké ọhịa ndị ahụ.

Mazị DanMallam Mohammed, kọmishọna ndị Uwe ojii n”Edo Steeti kọwara na-aga asụcha ọhịa ndị ahụ ruo ogo mita iri atọ n’akụkụ abụọ nke ụzọ ahụ.

Ọ sị na ndị ọrụ ya gana awabanye n’ime ọhịa ahụ kwa ụbọchị iji chọpụta ma tikpọkwaa àkwụ̀ ndị ekperime ahụ ebe a ga-ewelitekwa aka na nche n’ogologo ụzọ ahụ nile.

“A ga-asụ ọhịa ndị ahụ ihe dị ka ogo site mita iri atọ ruo mita iri anọ n’akụkụ ụzọ ahụ iji nye aka na ịhụta ụzọ nke ọma.

DanMallam kwukwara na ndị ọrụ ya buru ụzọ  wabanye n’ime ọhịa ndị ahụ ma tikpọkwaa àkwụ̀ (hideout) ndị ekperime ahụ tupu a malite ịsụ ha ọhịa ndị ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.