OGBUGBU NDI NAỊJIRIYA:MTN LAA UGBUA!-NANS

Spread the love

Makurdi: Otu ụmụ akwụkwọ na Naịjiriya bụ National Association of Nigerian Students (NANS) etierela ụlọ ọrụ nzikọrita ozi MTN ka ha laa na  Naịjiriya.

Nke a mere ụbọchị Fraịdee abalị iri abụọ n’isii nke ọnwa Julayị, oge ndị otu a mere ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ MTN na Makurdi bụ isi obodo, Benuwe Steeti maka ogbugbu a na-egbu ụmụ amaala Naịjiriya na Saụt Afrịka ka ọkụkọ.

Owoicho Abah, onye nlekọta NANS, mpaghara Ch(NANS Zone C) gbarụrụ ihu maka arụrụ ala na-aga n’ihu na Saụt Afrịka nke Gọọmenti mba ahụ achọghị itinye ọnụ.

“MTN kwara laa ma ọ bụrụ na ndi Saụt Afrịka gaa n’ihu na-egbu ndị Naịjiriya ka ọkụkọ.

” Ọ dị mwute na Gọọmenti mba Saụt Afrịka achọghị ịkwụsị arụrụ ala a ndị be ha na-arụ n’agbanyeghị na Naịjiriya gbara mbọ pụrụ iche iji kwụsị “apartheid” na Saụt Afrịka ”

N’otu aka ahụ  ndị NANS mekwara ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ MTN na Kaduna.

Sunday Adelekan, otu onye ndú NANS  kwuru okwu n’aha ndị otu ya

” MTN kwaranụ laa na Naịjiriya! Ụlọ ọrụ unu agaghị anọ na Naịjiriya na-arụ ọrụ, eburu ego ala ebe ha na-egbu ndị Naịjiriya na Saụt Afrịka”

Chetakwa na MTN bụ ụlọ ọrụ si Saụt Afrịka.

Iwe ndị ntorobịa Naịjiriya na-arịzị elu maka ogbugbu na mkpagbu ndị Naịjiriya ka na-aga n’ihu na Saụt Afrịka. Izu ụka gara aga ụfọdụ ndị ntorobịa mekwara ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ DSTV bụkwa ụlọ ọrụ ọzọ sị Saụt Afrịka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.