RUGA:NDỊ GỌVANỌ ỌWỤWA ANYANWỤ NỌ ỌGBAKỌ UGBUA

Spread the love

Enugwu: Okwu Ruga (ndị nchị ehi) so n’isi okwu Ndigbo tụrụ anya ka e lebaa anya n’ọgbakọ Ndi Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nọ ugbua bụ Sọnde, abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Julayị afọ 2018 n’Obi Gọọmenti Enugwu Steeti, Enugwu.

Ndị bịara ọgbakọ a gụnyere Rt. Hon Ifeanyi Ugwuanyi (Gọvanọ Enugwu / Ólé ọbịa) Omenka Dave Ụmahi (Onyeisioche ọgbakọ /Gọvanọ Ebọnyị Steeti), Dọkịnta Okezie Ikpeazu (Gọvanọ Abịa Steeti), Omenka Dọkịnta Nkem Okeke (Osote Gọvanọ Anambara Steeti) nakwa Mazị Gerald Irona (Osote Gọvanọ Imo Steeti).

Okwu ndị ọzọ Ndigbo tụrụ anya na ha ga-elebanye anya gụnyere; nhazikọrịta akụnụba (economic integration) nakwa ibulite ọnọdụ ọdụ ụgbọ elu Akanụ Ibiam, Enugwu.

Obi dịkwa Ndigbo ụtọ etu ndị gọvanọ ha siri gbadosie ụkwụ ike n’ala were jụ Ruga ma machikwa ndị nchị ehi iji ụkwụ achịgharị ehi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nile.

N’agbanyeghị na Gọọmenti Etiti ka kwụsịgoduru atụmatụ Ruga, a tụrụ anya na ndị gọvanọ a ga-etinyekwa ọnụ n’okwu ahụ ebe ha enwebeghi ọgbakọ kemgbe ahụ.

N’otu aka ahụ, Gọọmenti Etiti akagbubeghi atụmatụ Ruga kama a kwụsịgoduru ya ugbua.

Kepu kepu hoo!haa!! na-anụ bụkwa na a chọkwara isi ụzọ azụ owere were weghachite Ruga site n’ebumnuche Gọọmenti Etiti iweghara ikpere mmiri nile n’ala anyị ma sikwa otu a nyefee ndị Fulani nchị ehi ala ndị ahụ.

Ụzọ ọzọ ha nwere ike isi weghachikwa ya bụ site na imeghari Iwu Nnwere Ala (Land Use Act) ka ala nile dị n’ala anyị bụrụ nke Gọọmenti Etiti ga – enwere, karịa ndị Gọvanọ bụ ndị ọ dị n’aka ugbua.

Ndigbo na-atụkwa anya mwepụta atụmatụ ịkwalite asụsụ Igbo ka ndị Gọvanọ a siri kpebie n’ọgbakọ ha na Nike Lake, Enugwu kemgbe afọ 2017.

Ha malitere ọgbakọ ahụ ka o jiri ihe dịka nke iri abụọ were gafee elekere atọ nke ehihie.

Leave a Reply

Your email address will not be published.