MIYETTI ALLAH ISONYE N’ỌGBAKỌ ANYỊ BỤ MKPARỊ-SMBLF

Spread the love

 Ọgbakọ jikọtara ndị ndu mpaghara Ndịda na mpaghara Obinetiti ala anyị, Southern and Middle Belt Leaders Forum(SMBLF) akọwaala izi ndị Miyetti Allah maka ọgbakọ ndị ndu mpaghara Naijiria dị iche iche dịka oke mkparị

N’akwụkwọ ozi nke ndị isi otu a degaara Ọchịagha Abdusalam Abụbaka (Lagoro Ezumike) bụ onye kpọrọ ya bụ ọgbakọ maka nchekwa n’aha otu Kọmitii ime udo na Naịjiriya nke onyeisi oche ya, ha kọwara na Miyetti Allah abụghị otu na-anọchite anya mpaghara ọbụla.

Ndi tinyere aka n’ozi ahụ gụnyere ;Ichie Edwin Clark (PANDEF), Ichie Nnia Nwodo (Ọhaneze), Ichie Ayo Adebanjo (Afenifere) nakwa Dọkịnta Bitrus Pogu (Middle Belt Forum).

“Ọ bụ oke mkparị bụ izi Miyetti Allah, otu ndị nchị ehi maka ọgbakọ ndị ndu mpaghara dị iche iche n’ala anyị ebe e zighi otu ndị ọ̀kụ̀ azụ,  otu ndị ọrụ ugbo ma ọ bụkwanụ ndị ahịa

” Anyị hụtara nkea dịka oke mkparị nyere otu anyị tinyere na anyị na ndị otu a ịnọkọ n’ọgbakọ a pụtara ikweta na anyị na ndịa ji egbe AK-47 akpa arụ mana eyikwa ụmụ amaala ibe ha egwu n’akụkụ ala anyị nile nọ n’otu ụgbọ.

N’agbanyeghị nkea, ha kelekwara Ọchịagha Abụbaka maka mbọ ọ na-agba iweta udo na Naịjiriya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.