Ka a na-eti mkpu mwakpo ndị IPOB wakporo onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ Nzukọ Sineti Naịjiriya, Sinetọ Ike Ekweremadu na Nuremberg, mba Jamani, onye ndu IPOB, Mazị Nnamdị Kanụ enyekwala ụmụazụ ya ntuziaka ịwakpo ma nwụchikọọ Onyeisiala Naịjiriya bụ Muhammadu Buhari na njem ọ na-abịa na mba Japan.Read More →

Enugu: Ngosipụta akwụkwọ Polo Mall, Enugwu na-aga n’ihu ugbua n’ogige Polo  Mall (Polo Park), GRA, Enugwu. Site n’okwu Mazị Uche Anịoke, otu onye n’ime ndị nhazi ya bụ ngosipụta akwụkwọ ahụ, nke a bụ nke anọ a na-eme ya bụ mmemme. Anịoke bụ onye ọrụ mbipụta akwụkwọ (publisher) a maraRead More →

Abụja: Ogbeni Rauf Aregbeshọla, Mịnịsta ọhụrụ na-ahụ maka okwu ala-anyị (Interior) ekwuola na ọrụ mịnịstrị ahụ edoghi ya anya. N’okwu ya oge ndị ọrụ mịnịstrị ahụ na-anabata ya, Gọvanọ ahụ chịburu Ọshụn Steeti kwuru sị, ” A maghị banyere atụmatụ nakwa usoro ọrụ mịnịstrị a karịa ihe m na-agụta n’akwụkwọRead More →

…ndi IPOB wakpo onye Igbo ọbụla ọzọ ndi Gọvanọ ga-akpụlata ya Naijiria ka ọhụ ihe ọkụ ji ntị oke eme Abakaliki: Gọvanọ Dave Nweze Ụmahị nke Ebọnyị Steeti adọọla onyeisi otu IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanụ aka na ntị ka “ọ kwụsị ịyị ara”  N’ozi odeakwụkwọ mgbasa ozi ya, JemsRead More →

Abụja: Dọkịnta Anụeyiagụ Law Mefọ, onye nlekọta otu Igbo bụ Igbo (IBI) Foundation ekwuola hoo!haa!! na mwakpo ndị otu IPOB wakporo onye bụbu Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya, Ọkammụta Ike Ekweremadu bụ maka  ndọrọndọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023. Nkea bụ oge ọ bụ onye ọbịa na mmemme ụlọ mgbasa oziRead More →

Ọka: N’ihi oke mwakpo nakwa ogbugbu Ndigbo na-anatazị n’aka ndị nchị ehi ndị Fulani, Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Anambara Steeti akwadowo atụmatụ ịkpa ehi Igbo. Mazị Carter Ume, onye nnọchiteanya mpaghara Aguata 1 n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Anambara Steeti kpọrọ oku ahụ ụnyahụ n’ọgbakọ ụlọ nzukọ omebeiwu ahụ oge o kwukwara naRead More →

Ibadan: Gọvanọ Seyi Makinde nke Oyo Steeti dị egwu n’ụdị pụrụ iche. Ka ọ kpọlitere Seun Fakorede, onye dị iri afọ abụọ n’asaa dịka onye a ga-eme Kọmishọna, ude nwoke a “kpatara ego na-atụ oyi” na-edekwa ọzọ maka ime ihe kwesịrị nṅomi. Maka afọ ole ọ dị, Fakorede, onye gụrụRead More →

Ugwuta: Eze Abdul Fatar Chima Emetumah nke Ụmụọfọ, Ugwuta mere mmemme Iri Ji n’abalị mbụ n’ọnwa Julaị, afọ a. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị Igbo bụ ndị ụka taa mana e nwekwara ndị bụ ndị Ọgọ mmụọ nakwa ndị Alakụba. N’obodo a, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Alakụba manaRead More →

  Otu agbọghọ igbo egosiputago na ihe ejiri mara ndị igbo bu igba mbọ. Ya bu nwa ada bu nwata akwụkwọ mahadum nke Benin, onye aha bu Okojie Lydia. Gịnị ka nwa-ada a mere? Ya bụ nwa-ada, n’agbanyeghị mma ya so nne ya na-ebugharị mmanya ọtọbịrịbịrị a na-akpọ Zobo naRead More →

Ọka: Kanụ Nwankwọ, nwa-afọ Naịjiriya bụ ọka ibe n’egwu bọl Etoola Gọvanọ Wili Obianọ nke Anambara Steeti maka anya ọ na-eleta ndị ochie dike ndị mbụ gbaburu otu egwu bọl Rangers nke Enugwu bọl, ọtụtụ n’ime ha akaala ma nọkwara n’ọrịa. N’okwu ya oge ọ bịara  gọvanọ ahụ njem mkpọtụrụRead More →

Ado-Ekiti: Gọọmenti Ekiti Steeti amalitewo atụmatụ Ịgba n’anwụ ndị Atụrụ nga maka mwakpo akwamiko megide ụmụaka n’ụmụ nwanyị. Ọkaikpe Ukwu nakwa Kọmishọna na-ahụ maka Ikpe Nkwụmọtọ na steeti ahụ, Olawale Fapohunda eweputebuola ozi n’afọ banyere ụzọ dị irè isi belata mwakpo akwamiko na steeti ahụ. O kwuru sị, “oke ọnụRead More →

…Ụkọchukwu ọzọ zọrọ ndụ ya azọ n’aka ndị mwakpo ndị Fulani  Enugwu: Ndi Uwe Ojii nọ n’Enugwu Steeti ejidewo ma gbakwaa n’anwụ ndị asị gburu Fada, Pọl Ofu, onye ogbugbu ya n’akụkụ Ọ̀gwụ̀ na mbido ọnwa a butere nnukwu nsogbu. Ka ọ na-egosipụta ndị ekperime ahụ a na-enyo enyo dịRead More →

Enugwu: Ndi Otu Kegite nke IMT, Enugwu nọrọ ụbọchị Wenezdee gbagharịa gburugburu mahadum ahụ ịgbasa ozi megide mpụ dị iche iche. Ka ha na-agagharị, ha na-agụ egwu dị iche iche eji mara ndị otu ahụ bụ egwu “gyration” Mazị Ifeakandụ Vitalis Udoye bụ Chiefo, ya bụ onyeisi otu Kegite naRead More →

Legọs: Site n’ozi ụlọ ọrụ Ule akwụkwọ WAEC wepụtara maka ule akwụkwọ afọ a, steeti Ndigbo nile abụrụla ọkaibe site n’iso na ndị kacha mee ọfụma. Steeti iri kacha mee ọfụma gụnyere Abia, Anambara, Edo, Rivas,Imo, Legọs, Bayelsa, Delta, Enugwu nakwa Ebonyi. Steeti ndị bu klaasị n’isi bụ Jigawa, ZamfaraRead More →

Legos: Sunday Etim, nwa na-ebugharị unere dị afọ iri abụrụla onye ebumnobi o nwere ịlaghachi ụlọ akwụkwọ bịara na mmezu, ụnyahụ bụ Tọọzdee site n’enyemaka Facebook.  Mazị Wiliam Uche Mba,nwa afọ Abia Steeti bi na mba Amerịka ekpebiwo ịzụ ya n’akwụkwọ ruo mahadum. Ka ọ hụchara onyonyo nwatakịrị a ebeRead More →

Lọndọn:  Ọkammụta Filip Efiong, nta so na ndi ọbịa pụrụ iche ga-anọ na ihe ngosipụta  Biafra nke otu IPOB na-achịkọba na-amalite taa bụ Fraịdee na Mahadum Goldsmith, Lọndọn. Odeakwụkwọ Mgbasa ozi IPOB bụ Mazi Ịma Powerful kọwara na Filip Efiong, nta bụ nwa Osote Onyeisiala Biafra bụ Ọchịagha Filip Efiong,Read More →