WAMMAKO: ONYE OHI, ANA-ACHỤ ONYE OHI?

Spread the love

Abụja: Onye ohi a na-achụ onye ohi? Mba. Mana Sineti ala anyị emeela Sinetọ na anochite anya mpaghara Mgbago Ugwu Sokoto, Aliyu WAMMAKO onyeisioche Kọmitii na-ahụ maka EFCC n’agbanyeghị na ụlọ ọrụ EFCC na-enyocha ya bụ nwa amadị maka iri ngarị Njeri Naira Iri n’ise (N15billion)

Nwa amadi a bu ya na ndi kọmitii ọhụrụ a ga eleba anya na ihe ndị òtù EFCC na eme banyere mpu dị iche iche.

Wammako bu aka chiri steeti Sokoto n’afo 2007 ruo 2015, ebokwara ya ebubo na oriri ego ọha.

Na ozi agbasara n’afọ gara-aga nke ọtụtụ ụlọ ozi gbasara, aha nwa amadi a dị na aha akwụkwọ ndị EFCC, ebe ọ nwere nanị ya, otu Njeri naira na puku narị asaa(1.7Bn) n’ọba ego ya.

Ọtụtụ ndị edegarala EFCC ọzi gbasara nwa Amadi a, enwere nke ederede n’ọnwa ọgọọst n’afọ 2015.

Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ya bu agha a na-ebu megide iri ngarị nakwa izu ego ọha,  ọ kachasi ndị ji otu ọkwa ma obu nke ọzọ akpụwo afọ n’ala, ebe e weere ụdịrivnwa amadi a tinye n’isi Kọmitii Sineti ga-eleru anya n’usoro ụlọ ọrụ EFCC zi arụ ọrụ ha n’ụzọ ziri ezi.

hoo!haa!! na-ajụzị sị, “Onye ohi, a na-achụ  ibe ya?” Ọ pụtara na ọchịchị nọ ugbua, ma ndị ọchịchị etiti ma ndị omebeiwu, ejighị ibu agha megide iri ego ọha kpọrọ ihe. Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.